IGBO sị na omenala bụ ọbara na-ehù na ndụ àgbụrụ, ma sịkwa na ọ na-abụ a kọọ, gwute, a sị na ahọ amagbuola onwe ya. N’ịgbaso nke a, ọ kpọtụrụ akpọtụ ma zụọ azụọ na nso-nso a, dịka ndị obodo Ihiala dị n’okpuru ọchịchị Ihiala na steeti Anambra mere mmemme iri ji ọhụrụ ha, ya na mmemme Ịgba Ọfala nke eze ọdịnala obodo ahụ.
Mmemme ahụ bụ nke a nọrọ na ya wee chibesie ma nyekwa ụfọdụ ụmụafọ obodo ahụ mepụtàgòrò ihe dara ụdà echichi na nkwanye ùgwù, ma bụrụkwa oke mmemme dọtara ndị selitere isi na ngalaba dị iche iche, nke gụnyere ndị ọrụ gọọmenti, ndị e ji okwu ha agba ìzù na steeti ahụ, ndị enyị, ikwu na ibe, ndị ọgọ, ndị nwadiala na ndị ọzọ na-echere ha ezi echichè, bụ ndị bịara ịnọnyere ha na isoro ha nwee ya bụ obi añụrị.
Dịka ọ na-agọ ọjị na ya bụ mmemme, eze ọdịnala Ihiala, bụ Igwe Thomas Obidịegwu, onye weliiri Olisa kere ụwa aka elu, kèlèrè Ya n’ihi onyinye ndụ, nchekwa, ihe akụakụ na ihe enweenwe, ya na ọganihu na udo tọrọ àtọ o jiri gọzie obodo ahụ na ụmụafọ ya, ma ndị nọ n’ụlọ, ma ndị nọgasị n’ebe dị iche iche.
Ya bụ eze ọdịnala, onye ọñụ jupụtàrà obi jìri afọ ojuju wee nabata ma kelee imirikiti mmadụ ndị siri ebe dị iche iche wee bịa isònyèrè ha na ya bụ oke mmeme, obụnadị dịka o kpere ka ụkwụ ha jiri laa ka nkè ha jiri bịa abịa mma, ma kwekwazie ụmụafọ obodo ahụ nkwà ịga n’ihu n’iwetarà ha ezi ọchịchị, ikpe nkwụmọtọ, ịdịnotu, ya na ezi mmepe bụ ịgbà n’obodo ahụ.
N’okwu nke ya, onyeisi oche nchere oge n’okpuru ọchịchị Ihiala, bụ Maazị Greg Okafor onye bịakwara ya bụ mmemme kpọpụtàsịrị mkpa ọ dị na ndị Igbo ga-ejigidesi omenala ha ike, na-akwalite ya, na-emesi ya ike oge niile, ma na-asụsikwa asụsụ ha ike oge niile, iji hụ na nke ahụ efùghị ma ọ bụ nwụnyụọ anya. O kpekwazịrị ka Chineke gaa n’ihu ibuli obodo ahụ na ụmụafọ ya elu, ya na ime ka udo tọrọ àtọ na ịdịnotu guzosie ike na ya.
Na mbụ n’okwuchukwu ya n’ụlọ ụka ‘Immaculate Heart of Mary Catholic Church’ bụ ebe a nọrọ wee tụọ mmamma banyere ya bụ mmemme, onye ọbịa kwuru okwuchkwu na ya bụ òfùfè nro, bụ Ụkọchukwu Benjamin Odoh, onye sitere ụlọ ụka ‘St. Martin’s Catholic Church, Ihiala’ kpọkùrù onye ọbụla ka ọ bịakùte Chineke nso ma nabata Ọkpara Ya dịka onye nwe ya na onye nzọpụta ya, n’ihi na O wèrela ọbara Ya gbapụta ma kwụọ ụgwọ mmehie maka onye ọbụla n’elu obe.
Ndị dị iche iche e nyèrè nkwanye ùgwù na echichi na ya bụ mmemme gụnyèrè: Maazị Collins Agbasiere, Maazị Ody Chukwube, Maazị Julius Nwokemodo, na oriakụ Edith Ejezie, bụ ndị kọwara nke ahụ dịka ihe agbamume na ọkpụkpọ òkù ịga n’ihu n’ịrụ ezi ọrụ, ma kwekwazie nkwa na ha ga-akwado obodo ahụ ma werekwa akụnụba na ọgụgụ isi ha jeere ya ozi karịa.
Mmemme ahụ dọtara Kọmishọna steeti ahụ na-ahụ maka mgbasa ozi na ịkụziri ọhanaeze ihe ha kwèsìrì ịma, bụ Maazị C-Don Adịnụba; ya na Maazị Mr. Patrick Ụgbaja, bụ onyeisi oche ‘Anambra State Universal Basic Education Board’, ma bụrụkwa nke a nọrọ na ya wee rie ma ñụọ, ma gbakwa egwu ọdịnala dị iche iche.