A kpọkuola ụmụafọ Igbo ka ha na-akwalite njirimara ha

0
661
A kpọkuola ụmụafọ Igbo ka ha na-akwalite njirimara ha
Anambra bụ Dokịnta Willie Obianọ, mgbe ọ na-azọpụ egwu ka ọ natachara echichi ọhụrụ dika Ebubedike Aguleri nke Igwe Christopher Idigo nke Aguleri chiri ya na mmemme ọvala o mere n'izu ụka gara aga n'Aguleri.

Izunna Okafor dere akụkọ ndi a

DỤỌLA ndị Igbo n’ụwa gbaa gburu gburu ka ha jisie ike ma tinye aka n’ịkwalite na ichekwaba ezi njirimara ha na ọ natarachi ha iji hụ na o funahighị ha.

Kọmishọna na-ahụ maka ahụ ike na steeti Anambra bụ Dọkịnta Josephat Akabụike nyere ndụmọdụ a na mmemme icheta na ọ gbago otu ahọ o jiri rịgoro n’oche, nke eze ọdịnala Nanka bụ Igwe Godwin Ezeilo, bụkwa nke weere ọnọdụ n’obi Igwe ahụ dị n’okpuru ọchịchị Orumba North nke steeti Anambra. Ọ dụrụ nne na nna ka ha gbaa mbọ were asụsụ Igbo na-agwarịta ụmụ ha okwu ma na-kụzikwara ha ọtụtụ ihe ndị ọzọ e jiri mara ndị Igbo n’ihi na nke ahụ ga-eme ka ihe ndị ahụ gbanye mgbọrọgwụ n’ime ha, ma kọwaa na ịkụziri nwata asụsụ Igbo apụghịkwa ime ya ka ọ ghara ịma asụ asụsụ bekee.

O tozịkwara Igwe Ezeilo maka otu o si emezupụta ihe nile kwesiri na ọ ga-eme dịka eze ọdịnala n’ịtụ egwu Chineke, ma kpọkuokwa ndị Nanka ka ha gaa n’ihu n’inye ya nkwado iji hụ na ọ rụụrụ ọrụ ọma ya gaa n’ihu.

N’okwu nke ya na mmemme ahụ, onyeisi otu Ọhanaeze Ndị Igbo na steeti Anambra bụ Mazị Damian Okeke-Ogene kọwara na otu ụmụafọ Nanka siri wee nuputa n’igwè wee sonye na ya bụ mmemme gosiri na ọchịchị Igwe Ezeilo kemgbe otu ahọ gara aga dị ewu na ọkụkọ mma. Ọ rịọzịkwara ndị eze ọdịnala dị iche iche n’ala Igbo nile ka onye ọbụla tinye aka n’ọrụ na mbọ ahụ a na-agba ịkwalite njirimara na omenala Igbo maka na ọ bụ ebe onye bi ka ọ na-awachi.

GUO:  Otu a ga-esi gbochi nsogbu n'omenala ụfọdụ n'ala Igbo

Na mbụ n’okwuchukwu ya n’ofufe nro e jiri malite ịtụ mmamma ahụ, onye ‘Archdeacon’ nke  Nanka, bụ ụkọchukwu David Okpalaọnọnuju kwuru na ike nile dị n’aka Chineke, ma dụọ ndị eze ọdịnala na ndị nile nọ n’ọkwa ọchịchị ka ha were okwu Chineke hiri isi n’ihe ọbụla ha na-eme ma na-enwekwa mmetụta banyere ọnọdụ na ọdịmma nke ndị ha na-achị achị.

O kpere ekpere ka Chineke gaa n’ihu inye Igwe Ezeilo ogologo ndụ, amamihe na ezi ọgụgụ isi ka o wee gaa n’ihu n’ịchị ọchịchị ya n’ịtụ egwu Chineke dịka ọ na-eme.

N’ozi ekele ya, Igwe Ezeilo kelere ndị Nanka maka ezi nkwàdoha nye ọchịchị ya n’otu ahọ gara aga, ma rịọ ha ka ha gaa n’ihu n’ịkwado ya n’ime ahọ nke a, ọbụnadị dịka o kwere ha nkwa na  ahọ a ga-akawanye mma karịa ahọ gara aga.

Mmemme ahọ dọtara  ọtụtụ ndị mmadụ sitere n’ebe dị iche iche, tinyere ndị eze ọdịnala sitere obodo ọzọ dị iche iche iche, ma bụrụkwa nke a nọ na ya wee gbaa ọtụtụ  egwu ọdịnala dị iche iche ma nyekwa Igwe ọtụtụ ihe onyinye site n’aka ogbe dị iche iche dị n’obodo

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here