Ndọrọ-ndọrọ ọchịchị ga apụ ọkụ –Ndi amuma

0
682
Ndọrọ- ndọrọ ọchịchị ga apụ ọkụ –Ndi amuma
Nathaniel F. Olorunsola

Onyeisi Ụka Living Christ Gospel Church n’ala Nigeria    na mba ofesi bụ nnukwu ụkọchụkwu (Dọkịnta) Nathaniel F. Olorunsola, ebuola amụma  ma kwuwaa hooha na ọ bụ ezie na ọtụtụ mmadụ na otu ndọrọ ndọrọ ga-esonye na nhọpụta ọkwa gọvanọ ahụ a ga   -eme na steeti Ekiti n’ahọ a; mana ọ bụ otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị PDP ga-eturu ugo na ya bụ nhọpụta.

O kwuru na Chineke gwara ya na nhọpụta ahụ ga-esi ike ma kpụrụkwa ọkụ n’ọnụ n’ihi ọtụtụ ndị ga-apụta ịnaghara gọvanọ steeti ahụ bụ Ayodele Fayose ọkwa ọchịchị, tinyekwuoro mbuso agha dị iche gọvanọ ahụ ga-enweta site n’aka gọọmenti etiti; mana n’ime ihe nile ahụ, na Fayose ga-eturu ugo n’ihi na Chineke ga-eji ya wee kwara mgwa ọrụ n’ụzọ pụrụ iche na mpaghara ndịda anyanwụ ala anyị n’ogoogo gọọmenti etiti n’agbata ahọ 2019 na 2025.

N’ebe o metụtara steeti Osun, bụkwa ebe a ga-eme nhọpụta ọchịchị ọkwa gọvanọ, onye amụma Nathaniel kwuru na Chineke gwara ya na APC ga-eme ọtụtụ ihe dị iche iche iji wee turu ugo, mana otu ndọrọ ndọrọ PDP ga-eturu ugo ma ọ bụrụ na ha jikọta onwe ha, kpesie ekpere ike ma rụsiekwa ọrụ ike.

Ndọrọ- ndọrọ ọchịchị ga  apụ ọkụ  –Ndi amuma
Nathaniel F. Olorunsola

O kwukwara na Chineke gwara ya na ihe ga-akara onyeisi ala anyị bụ Muhammadu Buharị mma bụ iji nwayọ rịtuo n’ọkwa ọchịchị ahụ ma wepukwa uche n’ihe gbasaara ịzọ ọkwa ọzọ n’ahọ 2019, maka na ọ ghaghị ịda pịatapịa n’ihi ajọ ọnọdụ ahụike ya; ma sịkwa na otu PDP ga eguzosi ike ma gbanyekwa mgbọrọgwụ n’ihi na ọtụtụ ndị gbahapụgoro otu ndọrọ ndọrọ ahụ ga-alaghachite azụ, na-agbanyeghị na a ga-enwe ndị kwe na ndị ekweghị n’ihe gbasaara onye ga-eji aha otu ndọrọ ndọrọ ahụ wee zọọ ya bụ ọkwa.

N’ebe Atiku Abụbaka nọ, ya bụ nnukwu ụkọchukwu sị na nwa amadi ahụ bụ Atiku, kwesiri ịgbasi mbọ ike n’ihi na mmụọ ya na-agwa ya na ọtụtụ ndị gọvanọ PDP ga-achọ ka ọ bụrụ onye bụgoro gọvanọ ga-eji aha otu ahụ wee zọọ ọkwa onyeisi ala, bụkwazị nke na-egosi na Atiku ga-agbasi mbọ ike iji nweta ihu ọma.

O bukwazịrị amụma na ọtụtụ ndị ga-achọ ịzọ ọkwa onyeisi ala, ọkwa gọvanọ ma ọ bọ ọkwa Sineeti ga-anwụ ọnwụ ike ma ọ bụ e gbufuo ha, ma ọ bụrụ na ha akpachaghị anya, ma mekwa ka a mara na ahọ a bụ 2018 ga-abụ ahọ ọma nyere ndị na-erubere iwu Jehova isi.

N’aka nke ya,onye ndụ ime mmụọ ma bụrụkwa onyeisi oche ụka Cherubim na Serafim n’ụwa gbaa gburu gburu bụ Nnukwu Ụkọchukwu Samuel Adefila Abidoye mere ka a mara nke a n’okwuchukwu ahọ ọhụụ o kwuru n’Abụja ụbọchị ụka. O mekwara ka a mara na ọtụtụ ndị na-ewu ewu na ndị a maara aha ha n’ala Nigeria ga-anwụkwa n’ime ahọ a bụ 2018, ma ọ bụrụ na a akpachapụghị anya.

Ọ kpụkuzịrị ụmụafọ Naịjiria ka ha jisie ike n’ekpere ma na-echekwa obodo anyị na ndị ọchịchị n’ihu Chineke oge nile maka na ọ dịghị ihe mmadụ pụrụ ime, ma e wezuga Chineke.

N’ebe ọchịchị ala anyị dị, Onye Amụma Samuel kpọkuru gọọmenti etiti ka ọ gbaa mbọ kewapụtara  ụmụafọ Naịjiria ọtụtụ ohere ọrụ n’ime ahọ ọhụụ a, ma guzosikwa ọtụtụ ebe dị iche iche a na-akụzi ma na-amụ ọrụ aka na mpaghara dị iche iche n’ala anyị. Ọ dụkwara ha ka onye ọbụla hie asaa n’anya banyere ịchụ nta nkwado a ga-eme n’ime ahọ a na n’ahọ na-abịa abịa, iji gbochie okwe ndọrọ ndọrọ ọchịchị nkwafu ọbara, ọbụnadị dịka nhọpụta izugbe na-akpudobe nso n’ala anyị.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here