‘Icheta ezinaụlọ ndị agha tufuru ndụ ha dị oke mkpa’

0
523
'Icheta ezinaụlọ ndị agha tufuru ndụ ha dị oke mkpa’

Rose Oranye na Uchenwa Mba

ỌLỤ agha bụnọọ nke dị mma ịlụ ma bụrụkwa ọlụ nke onye hụrụ ọdinma nke obodo ya n’anya. Mmadụ ịbụ onye ọlụ agha abụghị nanị maka ịlụ ọgụ kama ọgunyere mmadụ ịbụ onye nchekwa obodo ya ka ndị ala ọzọ ghara iwakpo ala ya na mberede. Ọ bụ nke a mere na ụfọdụ mmadụ ma nwoke ma nwanyị n’achọ ịba n’ ọlụ agha ka ha wee bụrụ ndị nchekwa nye ala ha.

Abali iri na ise n’ ọnwa mbụ n’afọ ọbụla bụ ụbọchị a na- eme mmemme icheta ndi agha tufuru ndụ ha na agha dị iche iche.

Na ezie , ala ma ọ bụ obodo ọbụla nwere akụkọ agha ma ndị ọcha ma ndị oji. Ala anyi gabigara otutu ihe na oge agha dị iche iche, ọ kachasị mgbe a lụrụ agha Nigeria na Biafra,nke were afọ atọ na ọnwa olemole.

N’okwu ya na ofufe nru pụrụ iche e dobere na  nnukwu ụlọ ụka St Patrick dị n’Awka, gọvanọ steeti Anambra bụ Willie Obiano kọwara mmemme ahụ dịka oge dị nkpa iji gụkọ nkwado na ihe dị iche iche ndị agha na- atụnye maka udo na ịdị n’otu obodo a,ọ kachasị ime ka ọchịchị onye kwue uche ya kwudosie ike na Nigeria.

'Icheta ezinaụlọ ndị agha tufuru ndụ  ha dị oke mkpa’

Mgbe ọ na ekwu okwu chukwu n’ofufe nru ahụ,nnukwu ụkọchukwu nke ụka Katolik dị n’Awka,Bishọpụ Paulinus Ezeokafor,kwara arịrị banyere mkpmkpa ndị Fulani na-achịehi na-akpa na Nigeria ma kpọkue ọchịchỌ etiti ala anyị ka ọ gbaa mbỤ ime ihe kwesịrị ekwesị banyere I jide nd® na- akpa mkpamkpa ahụ na ị ta ahụhỌ out o kwesịrị.

Ezeokafor kwuru na ihe na-eme na Benue bụ ihe e kwesịrị ịwepụtara anya ma kwukwa na ọ bụghị ihe ndỤ uwe ojii ga-eme.

O kwupụtakwara nwute na ozu nile e niri na Benue n’izu ụka gara aga bụcha ozu ndị ụka ma kwukwa n’oge e luola na a ga akpagharị nkata banyere ọdịdị obodo Nigeria ka ndị mpaghara ọbụla were onyinye ọnatarachi dị be ha dozibe be ha.

N’ okwu ya banyere mkpa ọ dị icheta ndị agha tufuru ndụ ha maka obodo,   otu nwoke aha ya bu Chukwunaeche Eze kwuru na ọ kwesịrị ka a na eme mmemme icheta ndị agha ndịa tufuru ndụ ha iji gosi na ọlụ ha abụghị n’efu.

“ N’ezie, ọ dịghị ihe ọbụla a ga eji kwụ ụgwọ ọbara ndị agha ndị a ma ọbụghị ịkwanyere ha ugwu a nke ndị dị ndụ n’ejikọ aka ọnụ eme kwa afọ”

.  Mazị Eze na ndị ọzọ a gbara ajụjụ ọnụ n’ Awka  kwuru na ihe ozo ekwesịkwara imere ha bụ icheta ezi na ụlọ ndị agha nda tufuru ndụ maka ala nna ha.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here