Ndị Ebenatọ ahọpụta ndị ndu ọhụụ

0
587
Ndị Ebenatọ ahọpụta ndị ndu ọhụụ
Ụfọdụ n'ime ndị isi ụlọ akwụkwọ sekọndiri na mpaghara ọwụwa anyanwu Nigeria na ihe ọmụmụ ha mere n'Awka abali abụọ gara aga.

Izunna Okafor

 

 

NNUKWU oke ọñụ dara ụbọchị ụmụafọ Ebenatọ, bụ obodo dị n’okpuru ọchịchị Nnewi South  nke steeti Anambra nuputara n’ìgwè wee họpụta ma guzobe ndị ndu ọhụụ, bụ ndị ga-eduru obodo ahụ wee baa n’ogoogo ọnọdụ mmepe dị elu na ala e kwere na nkwa.

Ya bụ nhọpụta dara ụda, bụ nke weere ọnọdụ n’ama egwuregwu

Central School  ma bụrụkwa nke dọtara imirikiti ụmụafọ obodo ahụ sitere na mpaghara ebe dị iche iche n’ala anyị na na mba ofesi wee bata isonye na ya, n’ihi na ha ghọtara mkpa ezi ọchịchị dị n’obodo ma bụrụkwa ụmụafọ ọnọdụ mmepe nke obodo ha na-echu ụra nke ukwuu.

N’okwu ya na ọgbakọ ahụ, bụ nke a chịkọbara site n’aka otu n’ahụ maka ọchịchị obodo ahụ, bụ “Ebenator Development Union” (EDU); onyeisi oche kọmitii hụrụ maka nhazi nhọpụta ahụ, bụ Chiifu Evaristus Imoh kpọpụtasịrị ọkwa dị iche iche a ga-azọ, na usoro a ga-esi mee ya bụ nhọpụta, ma dụọ onye ọbụla ka o sonyesie ike n’amụmà ahụ ma were uche na amamihe wee tụọ akwụwọ ya na-ejighị aghụghọ ọbụla, n’ihi na utó na ọganihu nke obodo ahụ dị ha bụ ndị obodo n’aka.

Na mbụ n’okwu nke ya, eze ọdịnala obodo ahụ bụ  Igwe Chinewubeeze Ezejiburu, nke onye nọchitere anya ya bụ Onowu obodo ahụ, bụ Chiifu Sunday F. Okafor kpọkuru ụmụafọ obodo ahụ ka ha na-echeta ụlọ oge ọbụla ma na-echetakwa na ọ bụ akụ ruo ụlọ, a mara onye kpara ya, ma rịọziekwa ha ka ha na-akwado ndị ọchịchị ha ma na-agbasòkwa udo n’ihe ọbụla ha na eme, n’ihi na e wezuga ihe ndị a, na ọ ga-esiri obodo ọbụla ike

GUO:  A tụọla mmadu iri abụọ na abụọ nga maka ọgwụ ike n'Anambra
Ndị Ebenatọ ahọpụta ndị ndu ọhụụ
Ụfọdụ n’ime ndị isi ụlọ akwụkwọ sekọndiri na mpaghara ọwụwa anyanwu Nigeria na ihe ọmụmụ ha mere n’Awka abali abụọ gara aga.

ịga n’ihu ma ọ bụ iru ogoogo ha chọrọ.

Ntụli aka ahụ kpọnkwem bụzị nke malitere oge ọ fọdụrụ nkeji iri abụọ ka ọ kụọ elekere atọ nke ehihie ma bụrụkwa nke gara nke ọma, ngwa nwga, n’ụzọ doro anya na n’ụdị a hụtụbeghị kemgbe obodo ahụ jiri malite; n’ihi na ndị weghaara ọkwa ọchịchị nile ahụ bụ nnọọ ndị ụmụafọ obodo ahụ họpụtara na-enweghị onye guzogidere ha ma ọ bụ sị “E-è”, bụkwazị nke na-egosi n’eziokwu na ha maara ihe onye ga-emenwu maka na o nweghị ka onye dị, ụmụ nna ya na-amaghị.

Ndị ndu ọhụụ ahụ a họpụtara na ọkwa ha bụ ndị a: Ọkammụta Anthony Okechukwu – Onyeisi (President General),Ọkaiwu Francis Ndụbụọgaranya – Osote Onyeisi (Vice President), Mazị Bartholomeo Mbah – Ode Akwụkwọ Izugbe (Secretary General), Mazị Paul Anazodo – Osote Ode Akwụkwọ (Assistant Secretary) Nze Ikenna Okwudile – Odekọ Ego (Financial Secretary), Mazị Cyril Obianụmba – Ojide Ego (Treasurer), Mazị Paulinus Mbah – Onye Mgbasaozi (PRO),Mazị Joachim Adieme – Nnukwu Onye Nchịkọta (Chief Provost).

Ka ọ na-eto ndị ahụ a họpụtara ọhụụ, onye ndu obodo ahụ nke na-apụ apụ, bụ Chiifu Cletus Esomọnụ kwuputara afọ ojuju ya banyere otu nhọpụta ahụ siri gaa nke ọma, too ndị haziri ya na ndị tuuru ugo, ma nyekwazie ha ndụmọdụ ka ha were egwu Chineke na ịnụ ọkụ n’obi wee na-arụ ọrụ, ọ kachasị iji gosipụta na ntụkwasịobi ahụ ndị mmadụ nwere na ha abụghị nanị okwu egbugbere ọnụ.

 

Ọ dụrụ ha ka ha dị njikere ma kee ajị n’ume maka ihe iche aka mgba ma ọbụ ụfọdụ ọnwụnwa na mmajà ha aghaghị izute maka na ọchịchị adịghị mfe, ma  kpee  ka Chineke onye jiri

GUO:  Obianọ akpọọla oku ka a kwalite asụsụ Igbo

aka Ya wee họpụta ha n’ọrụ ahụ nyekwara ha aka ịrụ ya dịka o siri bụrụ ọchịchọ nke Ya, maka na Ya bụ onye dunyere nwata gaa nwụta nkakwụ ga-ekunyekwa ya mmiri ọ ga-eji kwọ aka.

N’okwu nke ya, n’aha ndị otu ya, onye ndu ahụ a họpụtara ọhụụ

bụ Ọkammụta Anthony Okechukwu toro ụmụafọ Ebenatọ nile maka ịhụta ha dịka ndị tozuru oke, wee binye ha ọkwa ọchịchị ka ha wee gara obodo ha ozi. Ọ rịọzịkwara ha ka ha gaa n’ihu ikpere ha ekpere na inye ọchịchị ha nkwàdo maka na ọdịghị ihe ndị ndu pụrụ ime ma ewezuga nkwado ndị ha na-edu.

Ụmụafọ obodo ahụ jizikwara ohere ahụ wee kpọkuo ọchịchị gọọmenti steeti Anambra n’okpuru Gọvanọ Willie Obianọ ka o mee obi ebere cheta obodo ahụ bụ nke nwere ọtụtụ ọnọdụ ọjọọ dị iche iche na-ebi ya aka mgba kemgbe ahọ ole gara aga, nke gụnyere: enweghị ọkụ latiriki kemgbe ihe karịgoro ahọ atọ; mkpamkpa ọjọọ dị iche iche ibo na-akpa n’obodo ahụ, bụ nke kwatugoro ọtụtụ ụlọ ma bibie ndụ ọtụtụ ụmụ mmadụ aka ha dị ọcha; enweghị ezi okporo ụzọ;enweghị mmiri ọñụñụ na ajọ ọnọdụ ndị ọzọ na-ebi ha aka ọjọọ.

Ndị ọzọ kwuru okwu na mmemme ahụ gụnyere Chiifu Emeka Mkparụ (Ọnwa n’Ebenatọ); Dọkịnta Harry Ọranezi (Onye gabụrụ ụlọ ọgbakọ omebe iwu etiti ala anyị n’oge gara aga); Rev. Fr.Donatus Ezenneka; Chiifu Edmund Ọgbụtụ (onyeisi oche E.D.U, ngalaba Legọọsị); Chiifu Celestine Obiọgụ (onyeisi obodo Ọsụmenyi ma bụrụkwa onye ndị otu ASATU zigara maka ileru anya na ya bụ nhọpụta); Ojiejo Chidịebere; Injinia Ikechukwu Umejesi (Onye ndụmọdụ pụrụ iche nye gọvanọ Obianọ n’ihe metụtara ọchịchị ime ime obodo, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ.

GUO:  Obianọ akpọọla oku ka a kwalite asụsụ Igbo

Ihe pụtakarịchara ihè na mmemme ahụ bụ idu ndị ahụ a họpụtara

ọhụụ n’iyi ọrụ, bụ nke e mere site n’aka Dọkịnta Harry Ọranezi, ma bụrụkwa nke ha ñụrụ site n’ibikwasị aka n’Akwụkwọ Nsọ bụ Baịbụrụ, wee were otu olu kwuwaa na ha ga-arụ ọrụ ha n’irube isi n’iwu.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here