Ntụli aka ‘Anambra Central’:Umeh erunyerela ezi usoro iwu nturu ugo ya

0
572
Ntụli aka ‘Anambra Central’:Umeh erunyerela ezi usoro iwu nturu ugo ya
Ntụli aka ‘Anambra Central’:Umeh erunyerela ezi usoro iwu nturu ugo ya

By Chinwendu Ụzọat

ONYE a họpụtara dika onye  ga-anochite anya  ndị  ‘Anambra Central Senatorial District’, Victor Umeh,  erunyela nturu ugo ya nye ezi usoro iwu.

Umeh, onye nke kwupụtara obi ya gbasara otu e si meghari nhọpụta ahụ e mere n’izu ụka gara aga, tinyekwara nturu ugo  ya  kwuru na ihe nile ahụ  a bụghị gbasara ya onwe ya mana ọ bụ ime ihe otu o kwesịrị.

O kwuru na site ka e si hazie ịtụgharị akwụkwọ ahụ na o zighi ezi mmadụ ọ bụna ịghasa usoro ahụ, nupuru iwu ala Nigeria isi, ma chọkwa ka o fekwa yabu obodo.

Ntụli aka ‘Anambra Central’:Umeh erunyerela ezi usoro  iwu nturu ugo ya
Ntụli aka ‘Anambra Central’:Umeh erunyerela ezi usoro iwu nturu ugo ya

Yabụ onye jibu ọkwa dịka onye isi oche All Progressive Grand Alliance (APGA) kwuru hoo haa na otu ụzọ a ga-esi nwee ọchịchị onye kwuo uche ya n’ụzọ bu ịgba bụ site n’onye ọ bụna nke chọrọ isonye ya ịgbasoro usoro ziri ezi “ndi nile gbochiri nhọpụta a I were ọnọdụ ihe karịr afọ abụọ, ahụlanụ na ọ bụghị maka Victor Umeh kama ọ bụ maka ọdịmma ndị mmadụ ya na maka ime ihe otu o kwesịrị.”

Umeh gara n’ihu kwuo na ndị ‘Independent National Electoral Commission (INEC)’ egosila ndị mmadụ na ha mara ihe ekwe na-akụ. O kwuru na otu ihe kacha mkpa na nke a bụ irubere iwu isi, na ndị INEC anabataghị aghụghọ na ọ bụ nke a mere na nhọpụta ahụ jiri gaa nkeoma. Umeh, onye nke ji aha ‘All Progressive Grand Alliance (APGA)’ we zọ ọkwa ma bụrụkwa onye turu ugo nwetara  ntuli aka ọnụ ọgụ ya dị  64,879.

Site na mmeri nke a Chief Victor Umeh nwetere, ndi APGA nwetere ohere mbụ na mbụ inochite anya n’ụlọ nzukọ sineti.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here