Nwanyị Loro Akwa Eke By Chinwendu Uzoatu

0
1014
Nwanyị Loro Akwa Eke
Akụkọ Ifo

O NWERE otu oge, ụmụnwanyị na-aga ọrụ ugbo wee pụta n’ụzọ hụ akwa bu sọ mma. Akwa ndị a mara mma, gbaa okpokoro ma na etokwa akpịrị.Ka ha kirichara akwa ndị a,ha chọpụtara na ọ bụ akwa eke. Otu onye n’ime ha kwuru na ya ga-achịrị akwa ndi a rie. Ha sịr\ị ya a nwakwala anwa rie akwa ndị ahụ na anaghị eri ya eri. Ma nwanyị ahụ gwara ha na nke ahụ gbasara ha na ihe ọsọrọ ya mee, na ya ga eririri akwa ahụ. Mgbe ha kparịtachara ụka ,onye ọ bụna gawara n’ubi ya.

Mgbe ha rụchara ọrụ wee na alọta n’uhuruchi, ha pụtakwara ebe ahụ ha hụrụ akwa eke n’akụkụ ọhịa. Nwanyị ahụ kwuru na ya ga-eriri akwa ndị ahụ hulatara chịkọrọ akwa ahụ nlie  wụnye n’abọ ya. Ụmụnwanyị ibe ya tiri mkpu ma dọọ ya aka na ntị ka ọ wụsa akwa ndị ahụ  ma ekwe akụtaghị onye ala ji.

Nwanyị Loro Akwa Eke
Akụkọ Ifo

Mgbe nwanyị ahụ laruru n’ụlọ ya, ndị be ya lelechara akwa ahụ ma gwakwa ya ka o ghara iri ha n’ihi na anaghị eri akwa eke eri; ma nwanyị ahọ kpọchiri ntị chịrị akwa ndị ahụ wụnye n’ite, gbanye ya mmiri sinye n’ọkụ.Mgbe o bidoro sụba asụ, ihe ite na-‘asụ bụ; “kputu kputu, akpọkwa m mmadu ala, kputu kputu, akpọkwa m mmadu ala.”

Ndị mmadụ jụrụ nwanyị ahụ ma ọ nụkwara egwu ite o sinyere n’ọkụ na-agụ; ma ọ tụpụrụghị ha ọnụ. Mgbe o sichara akwa ndị ahụ, o bidoro ribe ha n’otu n’otu ma ha ekweghị ya oriri nke ha na-ekwe ya ọtịta. Ọ chịrị ha wunye n’ime ikwe were aka odo sube ha, ma ha ekweghị agbari.Ihe o mezịrị bụ na ọ kwọrọ ọkwụrụ were ya loo ha n’otu n’otu dịka e si elo ụtara. Mgbe o lochara ha, ọ gara dinara ala.

GUO:  Akụkọ ifo: Haa hoo haa!

Mgbe eke nwe akwa ndị ahụ lọtara ebe ọ gara wee chọba akwa ya ma ọ hụghị, ọ kpọrọ ha oku ha wee za ya si ya, “nne anyị nọkwa n’afọ nwanyị a o o!” Mgbe nwanyị ahụ loro akwa eke nụrụ nke a, nnukwu egwu malitere tụba ya. Ka a na-ekwu, eke ahụ jiri iwe na ọnụma wee chọrọ ụmụ ya na-abịa.

Ọ na-abịa, ọ na-akpị ha, ha anọrọ n’afọ nwanyị ahụ na-aza ya. Nwanyị ahụ malitere gbawa ọsọ ma ndị be ya atụpụrụghị ya ọnụ n’ihi na ha dọrọ ya aka na ntị. Ka a na-eme, eke ahụ wee kworo gidigidi n’iwe na ọnụma wee bịaruo n’ebe nwanyị ahụ no we makwasa ya n’afọ, dọwaa ya,o wee si otu a nwụọ pịị.

Ihe mmụta:Isa ụsa adịghị mma.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here