
Chinwendu Ụzọatụ
NDỊ otu ‘Movement for the Actualisation of Sovereign State of Biafra (MASSOB)’ a dọọla ndị gọvanọ na ndị ọchịchị obodo dị iche iche dị na mpaghara ọwụwa anyanwụ Nigeria (South-East) aka na ntị ka ha ghara inyefe ala ọ bụna bụ ala ndị Igbo n’aka ndị Fulani na-achị ehi maka ịzụ ehi.
Onye MASSOB bụ onye dịrektọ na-ahụ maka mgbasa ozi bụ Sunny Okereafor kwuru na ịdọ aka na ntị a bụ n’ihi kepu kepu ha na-anụ na ụfọdụ ndị gọvanọ, tinyere ndị ọchịchị obodo ụfọdụ na mpaghara ahụ na-akpa aro; ha na ndị ugwu ndị okwu ahụ dị n’aka ka ha ga-esi were ụfọdụ ala ndị Igbo nyefee n’aka ndi Fulani maka izu ehi.
Okereafor dọrọ aka na ntị sị, “onye ọbụna na akpa aro ọjọọ a ga-amata ihe ọ ga-apụta bụ iwere ala Biafra nye ndị Fulani na-azụ ehi, nke anyị hụtara dịka arụ, nke na ọ bụghị sọ ha ga-akwụ ụgwọ ya kama ma ụmụ ụmụ ha.”

Ọ kọwara na o doro ewu na ọkụkụ anya na ndị mgbago ugwu kara nwee obosara ala karịa ndị ‘South-East’.Ọ gara n’ihu n’ịkọwa na o nwere ka ọ dị bụ iwere obere ala nke e zurughi ndị Igbo ịkọ ọru ugbo ga nye ndị Fulani na-azụ ehi.
N’otu aka ahụ, Bishọpụ ụka Katolik nke ‘Awka Diocese’, Paulinus Ezeokafor, akọwaala atụmatụ iwepụta ala maka ndị na-azụ ehi dịka mgbọ ogbunigwe nke na-eche mgbawa. Ọ gakwara n’ihu kọwaa na ọnọdụ ịzì anụ otu ebe bụ usoro ga-eweta nsogbu nke ndị Fulani na-azụ ehi na ndị ọlụ ugbo n’isi njedebe.
Bishop Ezeokafor, onye kwuru nke a n’Awka n’ofufe nru iji cheta 2018 ‘Armed Forces Rememberance Day na ‘St Patrick’s Catholic Cathedral’ kọwara na ogbugbu nke egburu ndị mmadụ na steeti Benue bụ nke a ga-eji ‘Operation Pyton Dance’ na Crocodile smile’ wee dozie.