E kwesịrị ikpe ndị na-achị achi ikpe ọchụ – Ọhaneze

0
606
Ohaneze

Chinwendu Uzoatu

ỌHANEZE Ndịgbo akatọọla yabụ otu kọmiti mmadụ iri e hibere, nke onye isi ya bụ osote aka na-achị Nigeria bụ Yemi Osinbajo.Yabụ kọmiti bụ nke ‘National Economic Council (NCE)’ hibere maka ileba anya na nsogbu na esemokwu nke dị n’etiti ndị na-achị ehi na ndị ọlụ ugbo n’ala Nigeria.

Onye isi oche Ọhaneze Ndịgbo bụ Nnia Nwodo, kọtọrọ otu kọmiti a n’Enugu site n’nkọwa si n’aka onye ndụmọdụ ya n’ihe gbasara mgbasa ozi bụ Emeka Atamah. Ọ kọwara kọmiti a dịka nke na-ekwesịghị ekwesị.

Ọ gbagwojuru Nwodo anya etu gọọmentị etiti ga-esi guzobe kọmiti nke ga-edoziri ndị ogbu ọchụ na ndị e gburu egbu.Ọ rụtụrụ aka na okwu ọnụ nke Miyetti Alla bụ nọọ nke gbara n’anwụ na ndị otu ha kpachara anya wee na-akpa nkpankpa nke ha na-akpa n’ala Nigeria.

Ohaneze

Ọ gbagwojuru Nwodo anya ihe a gaghị eji kpụrụ ha kpee ha ikpe kama ị bịa guzube otu kọmiti a.

Ọ gara n’ihu kwuo na a tụrụ anya na ndị ọbụna dara iwu nke obodo tiri na Nigeria ga-aga, e kpee ha ikpe dịka ọ dị n’iwu karịa  gọọmentị etiti ịga tinyebe ụdi aka a na ya.

Yabụ onye isi oche Ọhaneze rụtụkwara aka na kọmiti a e guzobere bụ nọọ ileda ụlọ ikpe anya, bu ebe e kwesịrị ikpe gbasara igbu ọchụ.

GUO:  Buhari ziga ndị agha ka ha ga kọba ugbo – Ohaneze

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here