Egwu Eke: Narị mmadụ nwụrụ, narị abụọ merụa ahụ na mpaghara ọwụwa anywanwụ – Otu nnọrọ onwe

0
511
Egwu Eke

Chinwendu Ụzọatụ

OTU ‘Civil Society Coalition (ICSCO)’ kwupụtala na ndị agha  gburu opekatampe otu narị mmadụ ma merụọ ndị mmadụ dị narị abụọ ahụ oge ndị agha hibere ‘Operation Egwu Eke'( Python Dance)’ na ‘mpaghara ọwụwa anyanwụ n’afọ gara aga.

Ndi otu a boro ndị agha ebubo site n’ ikwu na ha kpochapụrụ agbụrụ makana ha sitere na nnyocha nke ha mere wee chọpụta na e tufuru ndụ mmadụ ọnụọgụ ha ruru otu narị ebe narị mmadụ abụọ nọzị na mmerụahụ dị iche iche na ọlụsị.

Ndị otu a kwupụtara nke a na ọgbakọ izuzugbe ha nke e mere n’Enugu. Ndi tinyere aka na ‘communique’  bụ onye nchịkọba ha n’ala  Nigeria bụ Ọkammụta Obasi Igwe na Mazị Ikechukwu Bismark Oji.    Akwukwo  ‘Communique’ a gwara gọọmentị etiti ka ha ghọta uru ndụ ndị nke ya nile n’agbanyeghị okpukperechi na agbụrụ onye si, ma kwukwaa na nchekwa bụ oke na ọrụ mbụ na mbụ nke dịịrỊ gọọmentị

Egwu Eke

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here