Ịkpachapụ anya maka ọkụ ọgbụgba n’oge ụgụrụ

0
596
ọkụ ọgbụgba

Uchenwa Mba

OGE ụgụrụ bụ nnọọ oge ahịhịa nile dị n’ọhịa ji akpọ nkụ n’ihi na mmiri adịghị ezozị. Ọ nweghị mmiri na ede akwụkwọ ndụ. Nkea mere na ahịhịa ndụ nile n’akpọnkụ nke ukwu. Ngwa ngwa ọkụ bara n’akwụkwọ, onwuru ọkụ, mana ihe anyị na- ekwu ugbua bụ otu a ga-esi gbochie ma ọ bụ ịkpachapụ anya na oge ụgụrụ ka ọkụ ọgbụgba ghara ịdị.

Mmadụ ọbụla kwesiri ikpachapụ anya n’oge ụgụrụ a maka ọkụ ọgbụgba n’ihi na nke a bụ nnọọ oke ihe ndaba jọgburu onwe ya. Ọkụ igba ụlọ obibi, ụlọ ebe a na azụ ahịa, ụlọ ọlụ ma ọ bụ ubi na-eweta ntufu ọtụtụ ihe na iyi. Ọ bụrụ ụlọ obibi, onye ahụ ga-etufu ihe nile oji biri, ụfọdụ mmadụ na-etufu ndụ ha ma ọ bụ nwa ha na nkea. Ọ bụrụ ebe a na azụ ahịa, onye ahụ ga-etufu ngwa ahịa ya nile na ego ya nile na nkea. Ọ bụrụ ụlọ ọlụ, ihe nile dị mkpa n’ụlọ ọlụ ahụ efuo, ọ bụrụ ubi, ihe nile onye ahụ kụrụ n’ubi ahụ agbaa ọkụ.

Uzo ọzọ okwesịrị ka e si kpachapụ anya na oge a bụ na onye  ọbụla ọhia dị nso n’ulo ya, orue ọnwa iri na otu kwa afọ ọbụla, ọsụchasịa ya, kpaa oke n’ọhia ahụ maka ihe e ji akpa ọku (matches).Onye ji nkụ esi nri,sisie nri gbanyụọ ọkụ, ka ikuku ghara iburu ọkụ tinye n’akwụkwọ kpọrọ nkụ. Ọ kwesịkwara ka ndị isi na obodo ọbụla na-echeta ịgwa ụmụ okorobịa ha na achụ nta okwu maka ọghọm na-adiba n’ọkụ ọgbụgba.

Ndị ụlọ ọlụ na-ahụ maka ịgbanyụ ọkụ na gọọmentị ga-ejikọ aka ọnụ wee nye ndị ala anyị ọzụzụ maka igbochi ọkụ ọgbụgba. Gọọmentị kwesịrị inye iwu ka onye ọbụla nwere ụlọ ihe mgbanyụ ọkụ(fire extinguisher) n’ulo ya. Ụlọ akwụkwọ na ụlọ ahịa ọbụla kwesịkwara inwe ya ka ọ ga abụ e nwee ihe ntụmade ọkụ ọgbụgba ka e were ya gbanyụọ ọkụ ahụ. Ọ bụrụ na gọọmentị ga-enye iwu ka edebegasịa mgbayụ ọkụ ebe o kwesịrị, nke a ga enye aka ibeleta ọkụ ọgbụgba.

GUO:  Ọkụ agbagbuola ụmụaka atọ n'Obosi

ọkụ ọgbụgba

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here