Obiagbaọsọ Enukeme agbaala ahọ iri asaa na anọ

0
638
Obiagbaọsọ Enukeme
Onowu Enukeme na nwunye ya (n'etiti), ndị ụkọchukwu na ndị ọzọ ka agbasara ụka pụrụ iche maka mmemme icheta ọmụmụ ya.

IZUNNA OKAFOR

OBODO juru nnọọ gbịm  ụbọchị ụka, ebe ọñụ rịkwara ibe yaelu, dịka nwafọ steeti Anambra e jiri azụm ahịa wee mara bụ Chiifu Anthony Obiagbaọsọ Enukeme merubere n’ụzọ pụrụ iche mmemme ịgba ahọ iri asaa na anọ ya.

Ya bụ mmemme bụ nke weere ọnọdụ ụbọchị ụka gara aga n’ụlọ nkwari akụ “White Castle” dị n’obodo oke nwa amadị ahụ bụ Neni n’okpuru ọchịchị Anaọcha nke steeti Anambra, ma bụrụkwa nke e jiri ofufe nru pụrụ iche wee malite, bụ nke weere ọnọdụ n’ụlọ ụka St. James na Neni.

N’okwu ya na mmemme ahụ, aka na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obianọ kelere ndị Neni maka nkwado ha nye ọchịchị ya na out pati APGA na nhọpụta ọkwa gọvanọ ahụ e mere n’abalị iri na asatọ nke ọnwa Nọvemba ahọ 2017, ma tokwa ha maka ịtụnyere otu pati ahụ nakwa Mazị Victor Umeh, bụ onye jiri ya wee zọọ ọkwa ;’senate’ n’ọgbọ nta nkwado Anambra central n’abalị iri na atọ nke ọnwa Jenụwarị ahọ a, bụ nke mere ka ha nweta mmeri dara ụda.

Gọvanọ Obianọ, nke onye nọchitere anya ya bụ onyeisi ọrụ na steeti ahụ bụ Mazị Harry Ụdụh, kọwara na ọchịchị ya ga-aga n’ihu n’ịkwalite ọnọdụ nchekwa ndụ na akụnụba iji wee weta mmepe tọrọ atọ na steeti ahụ.

O toro ya bụ onye na-eme mmemme bụ Chiifu Enukeme banyere otu o siri were akụnụba Chineke jiri gọzie ya wee na-emetụ ndụ ụmụ mmadụ aka nakwa otu o siri si n’ụlọ ọrụ ya bụ TONIMAS Nig. Ltd nakwa ihe mwunye ya ndị ọzọ dị iche iche wee na-ekewapụtasị ohere ọrụ nye ụmụafọ steeti ahụ na ụmụafọ ala Naịjiria n’izugbe.

Na mbụ n’okwuchukwu ya, ụkọchukwu ọkammụta Anthony Chiegboka toro nwa amadi ahụ, ma kpọkuokwa ndị aka ji akụ ndị ọzọ ka ha na-eñomiri ndụ ya bụ agụ nwoke site n’inyere ndị ụwa na-atụ n’ọnụ nọ n’okirikiri ha aka.

Na nzaghachi, Chiifu Enukeme, onye bụkwa onowu ndị obodo Neni ma bụrụkwa nnukwu mmadụ e ji okwu ya agba izu n’otu pati APGA kelere Chineke maka Ngọzị ya, ma kelekwa imirikiti mmadụ ndị bịara mmemme ahụ isoro ya ñụrịa.

Obiagbaọsọ Enukeme
Onowu Enukeme na nwunye ya (n’etiti), ndị ụkọchukwu na ndị ọzọ ka agbasara ụka pụrụ iche maka mmemme icheta ọmụmụ ya.

N’otu aka ahụ, ọmarịcha oriakụ ya bụ  Mary Enukeme kọwara di ya dịka nwoke nwere obi ọma, obi umeala nakwa nwoke maara ka e si ahazi ezinaụlọ nke ọma dịka nna.

Ndị ọzọ kwuru okwu na mmemme ahụ gụnyere kọmishiọna steeti ahụ na-ahụ maka nkwalite ndị ntorobịa, ọmụmụ ọrụ aka na egwuregwu, bụ Dọkịnta Oriakụ Uju Nwọgụ; onye enyemaka pụrụ iche nye gọvanọ n’ihe gbasaara okwe ndọrọ ndọrọ ọchịchị, bụ Mazị Ejike Okechukwu; Chiifu Benjamin Okoye, Oriakụ Ngọzị Izuegbunam, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ, bụkwa ndị kọwara ya bụ nwoke dịka onye nwere obi onyinye na nwoke na-eji akụnụba ya echeta ụmụ mmadụ.

Ihe pụtakarịchara ihè n’oke mmemme ahụ bụ ịwa achịcha bekee e jiri me ya bụ ncheta ụbọchị ọmụmụ, inye na ịnara ihe onyinye dị iche iche, ịyọrị egwu nakwa ikesa ihe oriri na mmanya dị iche iche, bụkwa nke mere ka mmemme ahụ zaa aha a kpọrọ ya.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here