Obianọ ariọ ezi mmekọrịta n’etiti ndị okwukwe dị iche iche

0
587
Gọọvanọ Obianọ (n'etiti), Bishọpụ Isizo na ndị ọzọ na mmemme oriri onye nsọ Michael Tansi n'Onitsha.

AKA na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obianọ akpọọla oku ka e nwee ezi mmekọrịta, ịdị n’otu na ụtọ nwanne n’etiti ndị okpupkerechi dị iche iche na steeti Anambra iji wee kwalite ezi udo dị na steeti ahụ ka ọ bụrụ nke tọrọ àtọ.

Gọvanọ Obianọ kpọrọ oku a ka ọ na ekwu okwu n’àjà dị nsọ a chụrụ iji merube mmemme oriri “Blessed Michael Iwene Tansi”, bụ nke weere ọnọdụ n’isi ụlọ akwụkwọ Tansi dị n’Ọnịsha. O kwuru na ọchịchị ya ga-aga n’ihu n’imemila ndị ntọ, ndị ohi na ihe nile bụ ihe ịma aka n’ihu nye udo na nchekwa ndụ na akụnụba ụmụ mmadụ na steeti ahụ, ma sịkwa na ọ ga-eme ka ọnọdụ nchekwa siwanye ike na steeti ahụ, n’ọchịchị ya nke ugboro abụọ a.

Gọọvanọ Obianọ (n’etiti), Bishọpụ Isizo na ndị ọzọ na mmemme oriri onye nsọ Michael Tansi n’Onitsha.

O mere ka a mara na ọchịchị ya ga-anọgidesi ike n’ijikọ aka ọnụ, ha na ndị ụka n’amụma inwogharị ngalaba ọrụ ugbo na steeti ahụ ka nri wee bụrụzie atụrụ taba.

Na mbụ n’okwuchukwu ya na mmemme ahụ,  Bishọọpụ nyemaka nke ụka Katọliki na Dịọsiisi Ọnịtsha bụ  Dennis Isizọ toro Gọvanọ Willie banyere nturu ugo  ahụ dara ụda bụ nke o nwetara na nhọpụta ọkwa gọvanọ ahụ e mere na steeti n’abalị iri na asatọ nke ọnwa Nọvemba ahọ gara aga, ma rịọ ya ka o jide ka o ji n’ọrụ mmepe na ịgba dị iche iche ọ na-eti na ngalaba niile nke steeti ahụ.

Ọ kpọkuzịkwara ụmụafọ steeti Anambra na ndị ụka ka ha gaa n’ihu n’inye ọchịchị Gọvanọ Willie Obianọ nkwado ka o wee gaa n’ihu n’ọrụ o ji n’aka na n’imezuputa nkwa dị iche iche o kwere oge ọ na- achụ nta nkwado maka ọchịchị ya nke ugboro abụọ.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here