ỤGỤRỤ

0
585
oge ụgụrụ

Chinwendu Uzoatu

OKIKE kere ụwa kere oge di iche iche n’elu ụwa. E nwere oge udummiri nwee oge ọkọchị.Otu a ka e sikwa nwe oge ụgụrụ. Udummiri bụ oge e ji akọ ihe ubi. Nke a mere na ihe ubi na-ama poko poko n’oge a. Mmiri ozizo na-ezokwa, ebe nile na-aju oyi, mana oge ọkọchị bụ oge owuwe ihe ubi, ebe nile na-adị ọcha n’ihi na mmiri anaghịzị ezo n’oge a. Oge a na-abụkari oge oriri na ezumike. Ọ bụ n’oge a ka eji eme egwu ọnwa; oge ndị okenye ji akọrọ ụmụaka akụkọ dị iche iche dịka akụkọ ifo.

Oge ọzọ e nwekwara bụ oge ụgụrụ nke a nọ n’elu ya ugbua a. Oge ụgụrụ dị nnukwu mkpa n’ihi na ọ bụrụ na ụgụrụ e bughị, ị mara na ihe oriri ga-akọ n’ihi na mkpụrụosisi agaghị eme ọfụma n’afọ ahụ. Ụgụrụ na-ebido ma ọnwa ikpeazụ n’afọ na-eru, ya bụ ọnwa ekeresimesi, wee ruo n’ọnwa nke abụọ ma ọ bụ atọ n’ime afọ. Oge ụgụrụ na-abụ oge oke ikuku na oyi ọtụtụ, tinyere ọkụ ọgbụgba. Ọ bụkwa oge ahụ mmadụ na anụmanụ  ji akpọkarị nkụ.

Ọ na-emekwa ka mmadụ na-acha ntụ ntụ. Ajụjụ wee bụrụ, kedụ uru ụgụrụ bara? N’agbanyeghị ọghọm ndị a, ụgụrụ bara nnukwu uru n’ihi na dịka m kwuru na mbụ,ọ na-eme ka mkpụrụ osisi mịa nkeọma. Afọ ọbụna ụgụrụ buru ọfụma, mkpụrụosisi na-abụ atụrụ taba. Mana ọ bụrụ na ụgụrụ buru obere, ị mara na ha ga-akọ ụkọ. Ọ bụ nke a kpatara na ekpere onye ọbụna na-abụ ka ụgụrụ buo nke ukwu. Ya mere n’agbanyeghị oyi na ikuku ụgụrụ, agụụ ya na-agụsi ndị mmadụ ike makana ọ na-eweta ezigbo olile anya n’ebe mkpụrụosisi dị.

Oge ụgụrụ bụkwa oge ndị mmadụ ji ehi ụra nkeọma n’ihi na anaghị enwe ekpomọkụ.Nke a na-eme ka ndị mmadụ lakpuo ụra n’oge makana ụra ụgụrụ bụ onye rahụrụ ike ya.

Dika a nọ n’oge ụgụrụ ugbua, ebe nile kpọrọ nkụ n’ihi na mmiri anaghị ezo, mmiri ndị fọrọ afọ n’ala, ụgụrụ amịkọrọla ha. Ya mere na mmadụ, ma anụọhịa, tinyekwara osisi na ahịhịa juru ọhịa kpọchara nkụ na-acha ntụ ntụ. Na ‘agbanyeghị ihe ndị a, ezi olile anya dị. Ekene dịrị okike kere ụwa maka oge ụgụrụ.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here