Anyị ga-etutekwa ebe a na-esucha mmanụ agbidi – NNPC

0
593
Anyị ga-etutekwa ebe a na-esucha mmanụ agbidi – NNPC
Ụlọ olụ na-esucha mmanụ agbịdị.

ỤLỌ ọrụ ahụ okwu mmanụ dị n’aka n’ala anyị, bụ ụlọ ọrụ NNPC n’aha ịchafụ ekwuola na amụma na-aga n’ihu ugbu a iji nwogharịa ma tutekwa ebe ndị ahụ a na-esucha mmanụ agbadi n’ala anyị ka ha malitekwa ịrụ ọrụ ọzọ.

Onyeisi n’ahụ maka ihe gbasaara ọhanaeze n’ụlọ ọrụ ahụ, bụ Mazị Ndu Ughammadu mere ka a mara nke a, ma kọwaa na ụlọ ọrụ ahụ na-agbasi mbọ ike ugbu a n’ụzọ pụrụ iche iji hụ na e belatara kpam kpam ụkọ mmanụ ụgbọ ala n’ala anyị ma mee ka ya bụ mmanụ juputa n’ebe ọbụla nakwa n’oge ọbụla.

O kwuru na ụlọ ọrụ ahụ ga-arụnyekwu ọtụtụ ọdụ mmanụ ụgbọala n’ụfọdụ ebe n’ala anyị, ma kọwakwa n’otu aka ahụ, na ụlọ ọrụ a eguzobela otu nleba anya ọrụ ha ga-abụ ịnapụta ụmụ mmadụ n’aka ndị akpịrị ego, bụ ọdụ mmanụ ụgbọala ndị nnọrọ onwe, ndị na-ebuli ma na-akpa ọnụ ahịa mmanụ aka otu o siri masị ha.

Mazị Ughummadụ mere ka a mara na òtù nleba anya ahụ, bụ nke ndị mmejupụta ya gụnyere ndị sitere ”Department of Petroleum Resources (DPR)” na “Petroleum Procurement Pricing and Regulatory Agency, (PPPRA)” ga-eji aka ha wee nwụchikọọ onye ma ọ bụ ụlọ ọrụ ọbụla na-akpachido ya bụ mmanụ iji mee ka ọ dị ụkọ, ma ọ ọ bụ na-ere ya karịa otu nari naịra, iri anọ na ise maka otu lita, dịka gọọmenti sir kwàdo.

O kwuru na ndị ma ọ bụ ụlọ ọrụ dị otu ahụ ga-eji anya ha wee hụ ntị ha mgbe na-adịghị anya, maka na aka kpara ezeku udele, ọ kọọ mmụọ chibere ya ọzọ.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here