Ezeokafor agaala leta ndị ekpenta n’Oji River

0
583
Ezeokafor agaala leta ndị ekpenta n'Oji River
Ụfọdụ ihe onyinye Ezeokafor nyere ndị ekpenta ahụ.

Chinwendu Uzoatu

ONYEISI ụka Katolik nke Daịsis Awka bụ Nnukwu ụkọchukwu Paulinus Ezeokafor a gaala njem nleta n’ebe ndị ekpenta nọ n’Oji River nke a kpọrọ ‘Oji River Leprosy Centre’. O mere nke a site na nkwado nke otu nnọrọ onwe nọ na mba Germany bụ ‘Behginne V’.

Ezeokafor nyere ha onyinye dị iche iche nke gụnyere ihe e ji aga ije bekee kpọrọ ‘crutches’ iri na ise, ihe ndina ala iri na otu, ute, akpa osikapa, mba ji iri isii, ọtụtụ katọn ‘Indomie’na imirikiti ihe ndị ọzọ.

O kwuru na ebumnobi e ji mee nke a bụ iji sonye n’emume icheta ụbọchị ndị ekpenta n’ụwa nile ‘World Leprosy Day’.

O kwuru sị, “Taa bụ ụbọchị mbụ m na-abia ebe a ụbọchị ụka, nke dabara n’ụbọchị e ji echeta ndị ekpenta n’ụwa nile. Obi dị m anụrị n’ihe m na-ahụ taa. Anam ekelekwa otu ndị ọzọ dị iche iche na ndị mmadụ  o metụrụ maka nkwado ha na ebe a .”

Ọ gbarụrụ ihu otu ndị mmadụ si emeso ndị a ọbụladị mgbe a gwọchara ha ma kwuo na ekpenta a naghi ariakwa ha.

O wutere ya na gọọmentị Enugu Steeti e mebeghị ihe a rịọrọ ha nke bụ ka e bupu ndị ekpenta ahụ ebe ha nọ ugbu a ma tinye ha n’ebe ka mma.

Ezeokafor agaala leta ndị ekpenta n'Oji River
Ụfọdụ ihe onyinye Ezeokafor nyere ndị ekpenta ahụ.

O kwuru na arịrịọ abụghị ihe ka mma n’ebe ndị a nọ kama ka a zụọ ha n’aka ọrụ ka ha wee baara obodo uru. Ezeokafor gakwara n’ihu wee kelee otu “Beginne e.v.” maka nkwado ha  ogologo afo nile. O kwuru na otu ‘NGO’ a bidoro kwadobe dịasis Awka kemgbe 2006.

 

Ọ kowara na ndị otu a si Germany e nyela nkwado ha ọtụtụ ugboro na nke ndị ekpenta a di n’Oji River na ha na-akwado ya na njem nleta ọ na-abịa ebe ahụ. O kwuru na ihe gbasara ahụ ike na ha e wetala ọgwụ dị iche iche, ma na-enyekwa aka n’agụm akwụkwọ ha na mmuta. O kelere otu a n’ebe ọ dị ukwuu ma kwuo na ụlọ ndị ekpenta a dị n’Oji River bụ na okpuro  ya ka ọ dị na ya agaghị agbaghapụ ha.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here