Ọkụ agbaala Nkwọ Ogidi

0
670
Ọkụ agbaala Nkwọ Ogidi
Ụgbọ ala ahụ bu mmanụ mgbe ọ na-agba ọkụ.

Izunna Okafor

ỌKỤ ọgbụgba dị oke egwu nọrọ na ngwụcha izu ụka gara aga wee dakwasị nnukwu ahịa ahụ na-ekwo ekwo, bụ Nkwọ Ogidi, bụ ebe ọ nọrọ wee gbarikọọ opekata mpe, ihe ruru ọdụ ahịa asatọ n’otu ntabi anya.

Dịka ndị ọnọ mgbe o mere siri wee kọọ, ya bụ ajọ ọkụ ọgbụgba bụ nke malitere n’ụtụtụ wee kpaba ike bụ nke binwuuru oge otu nnukwu ụgbọ ala na-ebu mmanụ ikuku mmụọ (gas) jiri azụ wee chọọ ka ọ rịa Ugwu Nwansịke, wee ghachapụ n’ike, sukaịnyere otu tipa kwụụrụ onwe ya, ọkụ wee binwuru n’ihi mmanụ na-atasị n’ahụ ya.

Ndị aka ebe ahụ mekwara ka a mara ọ bụ mgbata ọsọ nke ndị ọrụ nsọnyụ ọkụ sitere Okpoko, nke ndị sitere n’ahịa “Ogidi Building Material International Market” nakwa nke ndị sitere n’obi gọọmenti dị n’Awka, mere ka ya bụ ọkụ ghara ịgbara gaba n’ihu ma ọ bụ mebie ọtụtụ ihe.

Otu n’ime ndị aka ebe ahụ kọwara na ụgbọ mmanụ ahụ si Ọnịtsha wee na-aga Awka, site n’Ugwu Nwansike ahụ, wee ruo mgbe ike gwụrụ ya bụ ụgbọ ala, nke na o nwezịghị ike ịrịgonwu ugwu ahụ, n’ihi na ụgbọ ala ya anọghị n’ezi ọnọ

Ọkụ agbaala Nkwọ Ogidi
Ụgbọ ala ahụ bu mmanụ mgbe ọ na-agba ọkụ.

dụ; o wee malite ịdaghachi azụ, ọ ghọtanwuzịghịkwa onwe ya, wee ga suo otu tipa kwụụrụ onwe ya n’akụkụ ụzọ, bụkwazị nke kpatara ya bụ ajọ ọkụ ọgbụgba.

N’okwu nke ya, onyeisi ndị uwe ojii n’Ogidi, bụ Mazị Mark Ijarafụ kọwara ya bụ ihe dịka nke jọgburu onwe ya, ma kwuo na site n’amara Chineke, na o nweghị onye ọbụla tụfuru ndụ ya na ya bụ ọkụ ọgbụgba.

GUO:  Ọkụ ọgbụgba ebibiela ọtụtụ ngwaahịa n'Ochanja

Ọ kpọkuzịkwara ma dọọ ndị nile na-akwọ ụgbọala aka na ntị ka onye ọbụla kpachara anya ya ma kpachapụkwara ụgbọ ala ya anya iji hụ na ọ nọ n’ezi ọnọdụ tupu o buru ya pụta iro maka na ndụ mmadụ abụghị ihe e ji egwu egwu.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here