Uru na ọghọm dị na otu onye ịzụ nwa

0
604

Uchenwa Mba

OGE dị ugbua, nanị nwanyị ịzụ nwa ma ọbụ nanị nwoke ịzụ nwa bụ ihe ụfọdụ mmadụ chọrọ.Ha chere na ọ bụ uzo ka mma n’ihi otu ihe si dị n’ oge dị ugbua. Otu onye ịzụ nwa bụ ihe dị na obodo ọbụla  nakwa mba ụwa nile. Ụfọdụ na-eme ya ka ọ bụzị omenala ma ọ bụ ihe isi ike na mgbanwe dị na ọgbọa kpatara nke a.

Mmadụ nwere ike ịjụ ma otu onye ịzụ nwa ọbụ ihe ọjọọ, ebe ụfọdụ na-asị na ọka mma nne na nna ijiko aka ọnụ zụọ nwa nke ọma. Nke bụ ezi okwu bụ na ọ ka mma nne ana nna ijiko aka  wee zụọ nwa ha. Ihe na akpata out onye ịzụ nwa bụ ọnwụ nne ma ọ bụ ọnwụ nna,nne na nna inwe esemokwu,nwanyi I biri onwe ya na-agba akwụna.

N’ezie,otu onye ịzụ nwa nwere ihe ọma nakwa ihe ọjọọ dị na ya.Ihe ọma dị na otu onye ịzụ nwa bu na nne ma ọ bụ nna nọ na ọnọdụ dị otu a na nwa m’ọbụ ụmụ ya na-enwe ezi mmekọrịta.Ha adịghị e zoro onwe na ihe ọbụla. Ọ bụrụ nwanyị di ya nwụrụ,ọ ga-agba mbọ ime ka ụmụ ya  mara na nna ha adịzịghị ndụ.

Ọkachasị mkpa ebe nwanyị e nweghị ụmụ nne di hụrụ ya na ụmụ ọ mụrụ n’anya. Ọ ga- eme  ka ha mara na ọ dịghị onye ga-e kwuru ha ọnụ ha. Ụmụaka ahụ ga-e buru nke ahụ n’obi wee na agbazị mbọ ige ntị nke oma na ihe nne ha n’agwa ha. Ọ bụkwa otu ahụ ka ọ dị ebe nwanyị nwụrụ anwụ.Ọ bụrụ na nwoke ahụ hụrụ nwunye ya na ụmụ ya n’ anya,ọ ga-agba mbọ ime ka ụmụ ya bụrụ ndị a zụrụ nke ọma n’ agbanyeghị otu o si siri ya ike ịchịkwa ụmụ ahụ.

GUO:  Ụwa ụmụnwanyị: Ụmụnwaanyị na ịzụ nwa (1)

N’ezie , ezi na ụlọ ebe ọ bụ otu onye na- azu nwa,ịhụnanya ụmụ ahụ, a dịghị eke ya eke. Ihụnanya ha na- adị  ebe  onye ahụ na-azụ ha nọ.

Nne ma ọ bụ nna na-azụ ụmụ, nsọpụrụ nke ụmụ aka ahụ, nanị ya nwe ya. Ọ bụ nke a ga-eme ka ọ dịrị ya nfe inye ha iwu ka ha ga esi na eme. Ụmụaka ahụ ga na esonyekwa na usoro ọbụla o debeere ha.

Ihe ọzọ bụ na ebe otu onye n’azụ nwa,ụmụaka ahụ ga na enwe ezi mmekọrịta na etiti onwe ha nakwa nne ma ọ bụ nna.Ha ga na akpakọrịta alo ma na ebukọrịta ibu ha na otu.

Ezi na ụlọ zuru oke gụnyere nne, nna na  ụmụaka.Ebe otu onye na-azụ nwa, ezi na ụlọ ahụ ezughị oke. Okwesighị ka  otu onyena-azụ nwa ma ọ bụrụ na ọ bụghị ọnwụ kpatara ya. Ọ bụnadị na iwu Chineke,ọ kwadoghị nwanyị ị mụrụ onwe ya nwa ma ọ bụ nwoke ị chụpụ nwunye ya wee zụba ụmụ nanị ya, ma ọ bụ nwanyị ị chịrị ụmụ ya gbapụ na be di ya wee zụba ụmụ nanị ya. Ụmụ nanị otu onye na-azụ ga na ahụta na ha adịghị ka ndị ọzọ.Ụmụaka ibe ha nwere ike iji ha na-eme ihe ọchị n’ama.Nke a ga-eme ka uche ụmụaka dị otu  a gba iwe na ebe nne ma ọ bụ nna ha nọ.

Otu onye ịzụ nwa, ọ kachasị nwanyị nwere ike ịdọghachi agụm akwụkwọ ụmụaka ahụ azụ tinyekwara ọganiru ha,ọkachasị mgbe ọlụ nwanyị na-alụ ezughị I ji nye ụmụ ahụ nri ma ya bụrụzịa ị kwụrụ ha ụgwọ akwụkwọ.

GUO:  Ụwa ụmụnwanyị: Ụmụnwaanyị na ịzụ nwa (1)

N’ebe ụmụaka ndị nne ha enweghị di chaa nọ,ọ na-abụ nsogbu n’ihi na ekwuru sị na nwa nwanyị zụrụ na-ata akwa ọkụkụ.Nke a pụtara na ụmụaka ahụ adịghị enwe ezi omume n’ihi akparamagwa nne ha. Ụmụaka dị otu a  na-apụ ma na-bata mgbe dị ha nma, na-anọ n’ọdụ ụgbọala. Ụfọdụ na-esokwa ndị ekperima na-ese anwụrụ ọkụ dị iche iche. Ọ bụrụ nwa nwanyị, ọ gbakuru nwoke.Ọ bụkwa nke a mere na ihe ọjọọ na-aba ụba n’obodo nile.

O kwesịrị ka gọọmentị tinye uchu ma leba anya ka ụfọdụ mmadụ si e bi ndụ ha ma nye  iwu ka ọ kwesịrị nwoke na nwanyị isi na- ebi ndụ.Nke a ga- eme ka enwee ala na obodo dị mma ma kwesị obibi nye  onye ukwu na onye nta.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here