Agwala ndi Igbo: Kwalite asụsụ Igbo ka ọ ghara ịnwụ

0
600

 Izunna Okafor dere akụkọ ndịa

AKPỌỌLA onye Igbo ọbụla ka ọgbaa mbọ ghọta, bulịe  ma nwee mmasị na  ịsụ  asụsụ ya. Ndi ma maka igbasa ozi na ihe gbasara asụsụ agwakwala  Igbo na onye kpọọ ọba ya nkpọkọrọ agbatobi ewere ya kpoo ahịhịa.

Nkea mere ụnyaa oge a na-eme mmemme icheta ụbọchị asụsụ dị iche iche na mba ụwa nile. Emere  nkea nke ọma  n’ụzọ pụrụ iche na steeti Anambra site n’ọtụtụ ihe  mmemme e mere n’ụlọ ọrụ dị iche iche.

Ya bụ ụbọchị bụ nke e weputara site n’aka otu mba uwa dum bụ ‘United Nations’ iji wee kwalite ọtụtụ asụsụ obodo na mba dị iche iche.

Iji merube ya bụ oke ụbọchị, ụlọ mgbasa ozi ‘Anambra Broadcasting Service’, Awka, mapụtara ọtụtụ oke ihe mmemme dị iche iche n’asụsụ Igbo ma kpọtakwa ọtụtụ ndị dị iche iche na-akwalite asụsụ na omenala Igbo ka ha bịa sonye na ya bụ mmemme wee kọwaara ụwa banyere asụsụ Igbo na mkpa ọ dị ịkwalite ya bụ asụsụ maka na ọ bụ ebe onye bi ka ọ na-awachi.

Ndị ọbịa na ya bụ mmemme nke gụnyere onyeisi na onye chọpụtara otu Sụbakwa Igbo, bụ Ọkammụta Pita Ejiọfọ; Dọkịnta F.O.F. Ọnwụdufọ (Okenye); onyeisi ụlọ ọrụ mbiputa akwụkwọ akụkọ ‘National Light’, bụ Sa Chuka Nnabụife; Oriakụ Uche Nwosu; Izunna Okafor, nakwa ọtụtụ ndị ọzọ, bụ ndị ịkwalite omenala na asụsụ Igbo na-amasị, ma bụrụkwa ndị jiri otu olu wee kpọọ okù ka onye ọbụla tinye aka n’ọrụ n’ichekwaba na nkwalite ya bụ asụsụ ka o wee ghara ịnwụnyụ anya naabọ.

GUO:  Igbo College na FRCN achịkọbala asọmpi asụsụ Igbo n'Enugu

Ha kpọkuzịrị onye Igbo ọbụla ka o nwee nghọta, ngàlá na mmasị banyere asụsụ ya na agbụrụ ya ma were ya kpọrọ ihe maka na ọ bụ ebe onye bi ka ọ na-awachi.

N’okwu dịkwa ka ibe ya, ụlọ ọba akwụkwọ Kenneth Dike dị n’Awka sonyekwara na ya bụ mmemme ụbọchị icheta asụsụ dị iche iche na mba ụwa site n’ịchịkọba nnukwu mmemme pụrụ iche.

Mmeme ahụ bụ nke weere ọnọdụ n’ụlọ ezumezu ọba akwụkwọ ahụ, ma bụrụkwa nke dọtara imirikiti mmadụ sitere n’ebe dị iche iche, nke gụnyere ụmụakwụkwọ, ndị nkụzi, ndị nkwalite asụsụ na omenala Igbo; ndị nta akụkọ nakwa ọtụtụ ndị ọzọ.

N’ozi nnọọ ya na mmemme ahụ, onye nọgodu ugbu a dịka onyeisi ụlọ ọba akwụkwọ ahụ, bụ Nwaada Nkechi Udenze kọwara asụsụ dịka ihe bara uru nke ukwu na ndụ mmadụ, ma kpọkuo onye Igbo ọbụla ka ọ mụọ asụsụ ọbụla o nwere ike ịmụtụ maka na o nweghị onye ma ebe ọ ga-ahụ onwe ya echi. O kwukwara na a na-esi n’ụlọ wee mara mma pụba ama.

Na ntụnye nke ha n’otu n’otu, onyeisi oche na mmemme ahụ bụ Ọkaiwu Christopher Onebụnne na onyeisi ngalaba ọmụmụ asụsụ dị iche iche na mahadum Nnamdị Azikiwe bụ Dọkịnta  Chinedu Uchechukwu kọwara na ụbọchị ahụ bụ nnọọ nke magburu onwe ya maka na ọ ga-enye aka ịkwalite ọtụtụ asụsụ na-anwụ anwụ, ọ kachasị asụsụ Igbo, bụ nke ndị otu UNESCO bugoro amụma n’ahọ 2012 na ọ ga-anwụ pịị ma funyụọ anya naabọ oge adịghị anya; ma kpọkuo ndị Igbo ka onye ọbụla , ọkachasị nne na nna, ụlọ akwụkwọ, ndị ụka na gọọmenti tinye aka n’ịkwalite ya bụ asụsụ.

GUO:  Obianọ akpọọla oku ka a kwalite asụsụ Igbo

Ndị ọzọ kwuru okwu na mmemme ahụ gụnyere: onyeisi ụlọ ọrụ “National Orientation Agency” na steeti Anambra, Ọkaịwu Charles Nwọjị, nke onye nọchịrị anya ya bụ Oriakụ Ọhakwe Uchenna; Mazị Uche Atuọna; Mazị Okor John; Izunna Okafor; Oriakụ Ada Ọbụezie; Oriakụ Victoria Ezejiọfọ; Mazị Frank Agụlụ; na ọtụtụ ndị ọzọ.

Ihe pụtakarịchara ihè na mmemme ahụ gụnyere egwu ọdịnala dị iche iche a gbara, akụkọ ihò a kọrọ, egwu ọnwa, okwu ntabi ire, gwa m gwa m gwa m, ịma mbem na ịkọwa asụsụ Igbo, bụ nke Izunna Okafor mere, ịtụ na ịkọwa ilu Igbo; ịfụ ọja, bụ nke Mazị Ọbụmneme Ezechukwu jiri wee mee ka mmemme ahụ zaa aha a kpọrọ ya.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here