Ahiara Dayosịsị: Bịshọọpụ Okpaleke A Gbaala Arukwaghịm

0
665
Bishọọpụ Okpaleke

Izunna Okafor, Chinwendu Uzoatu

BISHỌỌPỤ ụka katọliki na Dayọsisi Ahịara bụ bishọọpụ Peter Okpaleke agbaala alụkwaghịm n’ọrụ ụka ma chiliee aka elu na ya arụchaala.

Ya bụ bishọọpụ mere ka a mara mkpebi ya ahụ site n’ozi o zigaara onyeisi ụka Katọliki n’ụwa gbaa gburu gburu bụ Pope Francis. Ọ gosiputara obi mwute ya banyere nsogbu ahụ dị na dayọsis ahụ kemgbe ihe rugoro ahọ isii,  bụ nke ọ kọwara na ọ na-ebì ndụ ime mmụọ ya aka ọjọọ.

O kwuru na ọnụnọ ya na dayọsisi ahụ abaraghịzị ụlọ ụka uru ọbụla maka na ọtụtụ ndị ụkọchukwu na ọtụtụ ndị e ji okwu ha agba izu n’ụlọ ụka anaghịzị achọ iji anya wee hụ ya n’etiti ha, ma kọwaa na nke ahụ ga-eme ka ọrụ ya gharazie ịmịta mkpụrụ ọbụla.

O kwuru na ịrụ ọrụ na dayọsisi ebe ndị ụkọchukwu na-agba ya mgba karịa ịbụrụ ya ndị enyemaka bụ nnọọ nke ekwesighị ekwesi n’ihi na ọ ga-adọghachi aka elekere azụ n’ebe nzọpụta mkpụrụ obi na otúto nke ime mmụọ dị.

O gosiputara olile anya o nwere na nrịtu ya ga-eme ka ozi ọma na ntute malitekwa gaba nke ọma na dayọsis ahụ, ma sịkwa na ya dị njikere ijere Chineke ya ozi n’ụzọ ọzọ dị iche iche ya nwere ike.

Otu ọ dị, n’ihi alụkwaghịm ahụ bishọọpụ Ọkpaleke gbara,Pope Francis akpọlitela bishọọpụ Lucius Ugọjị ,nke dayọsis Ụmụahịa ka ọ nọrọgodụ dịka onye nlekọta anya dayọsis Ahịara ahụ, ma bụrụkwa mkpọlite nke malitere dịba ire ozigbo ozigbo

Bishọpụ Okpaleke bụ ụkọchukwu Awka Dayasisi ma nọrọkwa n’Awka Dayasisi tupu a họpụta ya dịka bishọpụ nke Ahiara Dayasisi n’afọ 2012, ka Bishọpụ Victor Chikwe nwụchara.

GUO:  Pope Francis etoola Bishọp Okpaleke maka ndidi o nwere

Ndị ụkọchukwu ndị Mbaise jụrụ ịnabata ya ma kwuo na ọ bụ otu onye n’ime ha ka a ga-ahọpụta dịka bishọpụ.  Pope Francis, onye gbarụrụ ihu n’agwa ọjọọ a ndị ụkọchukwu kpara  kwadoro inye ha ntaramahụhụ kwesịrị ha ma mechaa nye ha iwu ka ha dee leta wee rịọ Vatican mgbahara.

N’okwu ndi ‘Congregation for the Evangelisation of people’s’, nke e depụtara na ‘National Catholic Register’ gosiri na na-agbanyeghi na ndị ụkọchukwu ahụ dere edemede leta narị abụọ nye Pope I ji gosi ya irube isi na nsọpụrụ, ụfọdụ rụtụrụ aka n’ọgbatauhie ga-adị na ha na ya  bụ bishọpụ lụkọọ ọlụ ka e nwechara nghọtahie.

Ka emechara nke a, ndị ụkọchukwu ndị Mbaise a gakwara n’ihu jụ inabata Bishọpụ Okpaleke na-ekwu na ‘Vatican’ na-amanye ka onye n’abụghị nwa afọ ha bụrụ bishọpụ ha.

E kwuru na  I wezụga onwe ya n’ọlụ bishọpụ a nke Okpaleke mere  bụ nọọ nke nyere ndị dayasisi Ahiara ahụ ọńụ nke ukwu.

Onye isi ‘Ahiara Diocesan Catholic Men Organisation’ bu Chief Gerald Anyanwu kowari nke a dike mmeri n’ebe ndi uka katolik Ahiara dayosis no.

Onye isi ndị ụkọchukwu ‘Ahiara Diocesan Priests Association’ bụ Rev. Fr. Austin Ekechukwu kwuru na ndị Ahiara nwere ańụri nke ukwu. Mana ndị ụka fada ndị ọzọ abụghị ndị Ahiara gbarụrụ ihu maka ụdị omume ọjọọ a ndị Ahiara mere. Ha kwuru na nke a bụ ịtọ ụkpụrụ ọjọọ nke ga-eme ka ndị mmadụ bido inupuru ‘Vatican’ isi.

Ụfọdụ mmadụ gara n’ihu kwuo na nke a bụ arụ  jọgburu onwe ya na njọ ma sigbuo udele n’isi n’ihi na onye nche atụrụ Chineke na-alụ ọlụ ebe ọbụla a kpọrọ ya oku.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here