ASỊRỊ

0
693

Josephine Maduakonam

ASỊRỊ bụ ikwutọ mmadụ. Asịrị bụkwa akụkọ gbasara ndụ onye ọzọ nke na-adịghị mma.Ọ bụ okwu e kwuru mmadụ n’azụ nke bụ eziokwu ma ọ bụ nke bụ asị nke na ekwesịghị na ntị ọzọ ga-anụ. N’aka nke ọzọ, asịrị bụ ị kọ ma ọ bụ I kwu ihe ọbụla mmadụ nụrụ ma ọ bụ mmadụ hụrụ n’ebe onye ọzọ nọ I ji  mebi aha onye ahụ.

Na eziokwu, asịrị abụghị ezigbo ihe. Ọ jọgburu onwe ya na njọ.Onye asịrị bụ onye ọjọọ. Onye asịrị bata ebe a na ekwu okwu dị ańaa, ndị na-ekwu okwu e jiri anya gwa ibe ha okwu. Nke pụtara ka onye ọ bụla mechie ọnụ na agwọ nọ n’akịrịka.

O nwere aha e ji mara onye ma ọ bụ ndị asịrị. Aha ndị a bụ, ọ nọ na ndo a hụ ọnwa, ọ nọ n’ụlọ mara ihe zụrụ n’ahịa, asịrị gbaka ute  wee dịrị gabazie.

Ebe a na-ahụkalịsi ndị asịrị bụ na ezinaụlọ, ọ kachasi ebe a nụrụ ọtụtụ nwanyị ma mụkwa ọtụtụ ụmụaka. A na-ahụkwa ha ebe a na ańụ mmanya, ebe a na azụ ihe ọzụzụ na  ụlọ ọlụ bekee. A na-ahụkwa ha ebe a na akpa isi ma ọ bụ ebe a na-emezi isi a na akpọ ‘salon’,ebe e nwere ọgbakọ dị iche iche ọkachasị ndị inyom  na ọgbakọ ndị na-azọ ọchịchị ya na ebe ndị ọlụ aka nọ. Mgbe ụfọdụ, a na-ahụkwa ha n’ụlọ ụka.

Asịrị na-eweta esemokwu na etiti di na nwunye, nwanne na nwanne, ọgọ na ọgọ, agbataobi na ibe ya, enyi na enyi, mmadụ na ibe ya na etiti obodo na obodo.

Asịrị na-eweta iwe na ọnụma,ọrịa ọbara mgbanienu ebe onye emegidere nọ, akpọmasi,  ịkpa nsị na aja, ịkpa oke, ịnụ ogu, ize ndụ ma na ewetakwa ọnwụ.

Ọ dị ọtụtụ ihe na-eweta asiri nke ụfọdụ n’ime ha bụ  enweghị ọlụ, ekworo, ntajianya, na anya ukwu.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here