EZI-NA-ỤLỌ

0
1292

Chinwendu Uzoatu

EZI-NA-ỤLỌ bụ ewumewu nwere nnukwu ọnọdụ na ndụ ndị Igbo. Ọ bụ n’ezinaụlọ ka mmekọrịta mmadụ na ibe ya na-amalite. Nwa ọ bụla a mụnyere n’ezinaụlọ ọ bụla na-esite na ya mụta ihe gbasara mmekọrịta mmadụ na ibe ya tupu ọ pụta n’obodo.

Nghọta ndị Igbo gbasara ezinaụlọ dị iche na nke ndị ọcha. Ndị ọcha ghọtara ezinaụlọ dịka nna, nne na ụmụ ha, ma n’ebe ndị Igbo nọ, ezinaụlọ bụ nke metụtara ka ha ra biri n’otu ngwuru ma ọ bụ karịa. O metụtara nne, nna, ụmụ, ụmụnne, ikwunibe, ndị ọgọ w.d.g.

E nwere ụdị ezinaụlọ atọ. Ha bụ ndị a: Ezinaụlọ otu mkpuke, Ezinaụlọ ụbara mkpuke na Ezinaụlọ mbasa.

Ezinaụlọ otu mkpuke pụtara ezinaụlọ e nwere nanị otu usoekwu. N’ebea ka e nwere nanị nne, nna, ụmụ na mmadụ ole na ole binyeere ha dịka odibo ma ọ bụ ohu. Ọ na-ahia ahụ I nweta ụdi ezinaụlọ a n’etiti ndị Igbo.N’etiti ndị ocha ka a na-enwekar ụdị ezinaụlọ a.

Ezinaụlọ ụbara mkpuke bụ ebe  nwoke nwe ụlọ na-alụ karịa otu nwanyị, ya bụ ebe nwoke na-alụ igwe nwanyị. Ihe e ji amata nke a bụ ụbara usoekwu, tinyerekwa ekworo ma ọ bụ ndọrọndọrọ nwunye di.

Ezinaụlọ mbasa bụ ihe e jikarị mara ndị Igbo. Nke a metụtara nne, nna, ụmụ, ụmụnne nwoke, ụmụnne nwanyị, ikwunaibe dị iche iche, tinyekwara ndị ọgọ. Ụdị ezinaụlọ a bara nnukwu uru.Ọ na-enye aka izulite ụmụaka n’omenala a mụnyere ha n’ime ya. Ọ na-eme ka ahụhụ belatara ndị okenye n’ihi na ọ na-abụ a zụchaa ụmụaka, ha amalite ilekọta ndị zụrụ ha. Ọ na-eme ka obi sie ndị nọ n’ime ya ike n’ihi na igwe bụ ike. N’agbanyeghị uru ndị a, ezinaụlọ mbasa nwekwara ọghọm nke gụnyere na onye aka siri ike na ya na ata ahụhụ n’ihi na ndị ọzọ na-echekwube na ya.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here