SORO M CHIA

0
856

Chinwendu Uzoatu

OKWU na Ụka

N’OTU oge, otu okorobịa aha ya bụ Okwu gara na be otu agbọghọbịa aha ya bụ Ụka.

Ụka bụ nwagbọghọbịa ya na ya na-adị na mma, onye ọ chọrọ ịlụ. Mgbe ọ gwara nna Ụka ije o ji maka ya bịa, nwoke a jụrụ ya aha ya, ọ zaa ya na aha ya bụ Okwu.

Ị sị gịnị?

Okwu

Gịnị?

Okwu

Nnaa bịa laba maka na Okwu lụọ Ụka, ezinaụlọ ahụ ga-abụ Okwu na Ụka, mgbe ahụ, ọ bụrụ katakata, onye kwuo, ibe ya ajụ.

Otu onye na-aza katikizim 

Otu nwoke gara ule maka ime mmirichukwu. A na-aju ya, ọ na-aza.Ma mgbe a jụrụ ya uzo mmụọ ole dị? Nwoke a mumurie ọnụ ọchị gwa onye nkuzi ụka na nke ahụ bụ ofe nkupu .Mmụọ ndị obodo anyị ehika. Otu bụ ịzaga, nke ọzọ bụ ijele, ndị ọzọ bụ udo, ọgbamgbada, odudum, ụlaga, ojiọnụ, mgbadike w.d.g.

Onye nkuzi ụka tiri mkpu ma jụọ ya, “enyi kedụ nke I buuru ihe arụsị bata na ụlọ ụka? Abịazịkwala ụbọchị ọzọ.”

Nwoke tiri nwunye ya ihe n’ụtụtụ  

O nwere otu nwoke na-eti nwunye ya ihe abalị ọbụna. O wee ruo otu ụbọchị, o tie nwunye ya ihe n’oge ụtụtụ. Mgbe ndị agbataobi ha gbatara ọsọ, otu nwoke jụrụ ya sị ya, mgbe nile ka ọ na-eti nwunye ya ihe n’abali, ọ gịnị kpatara o ji jiri ụtụtụ tie ya ihe taa. Nwoke ahụ tiri nwunye ya ihe zara ya sị, “ọ kwa nke e mere, ọ gaa.”

GUO:  Nwanyị Loro Akwa Eke By Chinwendu Uzoatu

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here