Uru ọjị bara Uchenwa mba

0
3215
uru Oji Bara
Oji

ỌJỊ bụ mkpụrụ osisi bara uru nke ukwu. Eji ọjị eme ọtụtụ ihe. Ọjị na-enye ego nke mere na  ndi ala anyị na-ebuga ya ala ọzọ iji kpata ego.

Ọjị na-amị dịka mkpụrụ osisi ndị ọzọ si amị ma  ihe ọjị ji di iche bụ ihe e ji ya eme, ọkachasi n’ala Igbo. A na-akọpụta ọjị n’ala Nigeria mana ebe a na ewepụta ya ebe o buru ibu bụ n’ala Yoruba.

Ndị Igbo na-akọ ọjị ma ọ bụghị ebe o buru ibu. Ọjị dịkwa ụdị  dị iche iche.O nwere ọjị nke na-adi nanị abụọ ma a waa ya. O nwekwara nke na-adi atọ,anọ ma ọ bụ karịa ma  waa ya. O nwekwara nke ndị Igbo na-akpọ ọjị ugo.

N’ihi otu ndị ọwụwa anyanwụ ala anyị siri kpọ ọjị ihe bara uru, nke a mere na ha ejighi ya egwu egwu chaa. Mmemme ọbụla onye Igbo na-eme, ọjị bụ ihe izizi ọ ga-edebe na iru ndị ọbịa ya iji gosi na ya nabatara ha na be ya tupu ekwube okwu nri ma ọ bụ mmiri. Ọjị bụ ụzọ ndị Igbo si egosi ezi mmekọrịta na etiti enyi na enyi, otu na otu.

Onye ya na mmadụ na-atakọrịta ọjị a naghị eme ya ihe ọjọọ N’ala anyị, ọjị bụ  ihe bara uru n’uzo dị iche iche.Ndị Yoruba na-akọpụta ya n’ụbara ma na-atakwa ya, ndị Hausa na-atakwa ya ebe o buru ibu mana ndị Igbo nọ ka  ha ka ha mara uru ọ bara. Ọ bụghị nanị ịta ọjị kama ha ji ya e me udo, ha ji ya a lụ nwanyị, ha ji ya e gosi ịnabata onye ọbịa.Ndị Igbo jikwa ọjị e kpere Chukwu . Onye Igbo ọ bụla na-eme mmemme aghaghị iwepụta ọjị iji nabata ndị bịara  be ya. Ọ bụrụ na a mụa nwa ọhụrụ, ọ bụ ọjị bụ ihe mbụ a na-eweta.Onye nwee ego, o tinye na ya, agbata obi na ikwu na ibe ataa ọjị ahụ wee kelee Chukwu maka afọ ọma ya.

GUO:  Uru na nsọ gbasara ọji

Ọjị sokwa na mkpụrụ osisi e ji a kpata ego.Ndị na-azu ahịa ọjị na-echekwa ya nke ọma. Nke a mere na ọjị na-adịgide n’udu mmiri na ọkọchị . Ọjị nwere mgbe o ji ebu ibu ma nwekwa mgbe o ji ebilata mana ọ bụghị na ọ ga-akọ. Ọjị bụ mkpụrụ osisi na-adi afọ kwuru afọ.N’ezie,onye nwere ugbo ọjị ,ego agaghị akọ.

Ejikwa ọjị emebe ụfọdụ mmanya.Onye ọbara ya gbaturu agbatu(low BP) na-atakwa ọjị  bulite ya.Onye achọghị ịlahụ ụla na-atakwa ọjị iji mụrụ anya. Onwekwara ihe dị n’ọjị e ji emebe ọgwụ.Anyị malite ịkọpụta ọjị ụba dịka ndị Yoruba, o ga enyeaka ịkwalite ikpata ego nye ala anyị dịka koko si a kpatara ala anyị ego.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here