Alụ: Obodo agbaala ụlọ ụka jikọrọ ụmụnne di na nwunye ọkụ

0
591
Burnt Anambra Church

NDỊ  ntorobịa n’Agba Ekwulobia, nke dị n’okpuru ọchịchị Aguata na Steeti Anambra agbaala otu ụlọụka ọkụ maka ịgba nwanne na nwanne otu nne ji akwụkwọ. Aha ụlọụka a bụ ‘Dwelling Fullness of God Church’, Ekwulobia.

Chinwendu Uzoatu

Chiadi Ezeibekwe, onye gbara afọ iri abụọ na ise kpọọrọ nwanne ya nwanyị dị afọ iri na asaa ga gbaa akwụkwọ n’ụlọ Uka a nke dị n’ogbe ha bụ Agba n’Ekwulobia.

Akụkọ kọrO na onye ụkọchukwu gbara ha akwụkwọ bụ nwanne ha nwoke nke nnukwu, onye bụ ụkọchukwu n’ụlọụka ahụ, nke aha ya bụ Chijioke Ezeibekwe.

Ọhaneze hụrụ nke a dịka nsọala nke mere ka ha tinye ọkụ n’ụlọụka ahụ.

Chiadi Ezeibekwe bụ onye lụrụ nwanne ya nwanyị, gbadosiri ụkwụ ike n’ala site n’ịkọwa na akwụkwọ nsọ Deuteronomy 36:6 kwadoro nwanne ịlụ nwanne ya nne ji ya na ya.

Otu o sila dị, otu onye ụka ahụ bụ Daniel Ezeobi, n’okwu o gwara ndị nta akụkọ, ekwenyeghị na nke a ma rụtụkwa aka n’akwụkwọ nsọ Lev. 18:19, ebe na-akwadoghị nwanne na nwanne ịlụ di na nwunye. Ezeobi kọwara alụm di na nwunye a dịka nsọala na ihe arụ.

Ezeobi gakwara n’ihu kwuo na ọ bụ otu nwanne nwoke Chiadi nke nnukwu bụ Emeka bụ onye kpesara onye isi ụmụnna maka nke a, nke mere ka onye ahụ kpọọ ezinaụlọ a nzuko ntụmadị n’egbughị oge ọ bụla ma gakwaa n’ihu kpọkọọ ndị ntorobịa maka nke a.

Nna ụmụnne abụọ a lụrụ onwe ha, onye nke e nyere aha ya dịka ‘Luisco’ n’aka nke ya kwuru na mkpa ya ugbu a bụ ụzọ ọ ga-esi pụta n’Udi ihe dị otu a ebe ọ bụ na ihe mere eme emeela.

GUO:  Alụ: Ndị nkuzi na-akwasazị ụmụakwụkwọ ha iko

Nne ha bụ onye kwuru na ụdi alụmdi a dị n’akwụkwọ nsọ ma rụtụkwa aka na nwa ya nwoke kwụrụ ụgwọ isi nwanyị dịka o kwesịrị.

Burnt Anambra Church

Otu onye obodo ahụ kọwara ụmụnne abụọ a lụrụ onwe ha dịka ndị batra n’ụlọụka ahụ ọhụrụ. O kwuru na kamgbe e mechara ha mmirichukwu n’ụlọụka ahụ ihe dịka afọ abụọ gara aga na o nwechara ka agwa ha siri dị tinyere nkuzi asị nke ha na-akuzi nke mere ka e nye ha oche azụ n’ụlọụka ahụ.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here