Alụm di na nwunye

0
1467
Alụm di na nwunye

ALỤMALỤ bụ ijiko nwoke na nwanyị dịka di na nwunye ka o siri dị n’omenala. Alụmalụ bụ nnukwu ihe na ndụ ndị Igbo. Ọ bụ nke a ga-eme ka ụmụ ha ga-amụta bụrụ ụmụ ziri ezi n’anya ọhaneze.

Chinwendu Uzoatu

Ụdị alụmalụ dị iche iche

Alụmdi otu nwoke na otu nwanyị: Nke a pụtara nwoke ịlụ otu nwanyị. N’oge gboo, a na-ewe nwoke na-alụ otu nwanyị dịka onye aka esighi ike, ma ugbua, ihe agbanweela.

Alụmdi otu nwoke na igwe nwanyị: N’oge gboo n’ala Igbo, ndị mmadụ na-ahụta onye na-alụ igwe nwanyị dịka ọgaranya. Ma ugbua, ọdịzịghị otu ahụ n’ihi na ihe agbanweela; ma ka o sila dị, ịlụ igwe nwanyị bụ ihe e ji mara ndị Igbo n’oge gboo.

Alụmdi nwanyị na nwanyị: Nke a pụtara nwanyị ịlụ nwanyị ibe ya. N’ụdị alumdi a, ọ bụ nwanyi na-eme ego nwanyị n’isi nwanyị ibe ya. Ihe dị iche iche na-akpata nwanyị ịlụ nwanyị ibe ya dịka enweghị nwa nwoke n’ezinaụlọ ma ọ bụ amụtaghị nwa ọbụla.

Alụmdi ma ọ bụ nwunye na nwata: Nke a bụ mmadụ ịlu di ma o bụ nwanyị mgbe ọ ka dị na nwata. Ihe na-ewetekarị nke a bụ amụtaghị nwa nwoke n’oge, ịmụta nanị otu nwa nwoke, nnukwu ịhụnanya dị n’etiti ezinaụlọ abụọ dgz.

Nkuchi nwanyị: Nke a pụtara na nwa nwere ike iweghara nwunye nna ya ma nna ya nwụọ. Otu aka ahụkwa, nwanne nwere ike iweghara nwunye nwanne ya nwụrụ anwụ. Tupu e mee nke, a na-aga be nna nwanyị, mekwa omenala ụfọdụ.

Alụm di na nwunye

Alụmdi na nwunye dị otu a ga-eme ka ụmụ a mụtara ka a kụchichara nwanyị ahụ bụrụ ụmụ nwoke ahụ kuchiri ya.

GUO:  Ọ dị mma nwaanyị ịgwa nwoke ka ọ lụba ya?

Nhachi nwanyị: Ọ bụrụ na nna amụtaghị nwa nwoke n’ala Igbo, o nwere ike ịhapụ otu nwa ya nwanyị ka ọ mara ma o ga-esi n’aka ya nweta nwa nwoke. Nke a pụtara na ụmu nwanyi ahu ga na-aza aha nna nne ha ka a ga-asị na ụ bụ ya bu nna ha.

Ịlụchiri mmadụ ma ọ bụ alụsị nwanyị: A na-eme nke a n’ebe dị iche iche n’ala Igbo. Ihe dịka a lụchaa agha, n’oge gboo, a na-agwa ndi emeriri n’agha ka ha lụchie ụmụ nwanyị ndị ha gburu ma ọ bụ ndị ha tọọro. Ọzọ bụ na onye gburu nwunye mmadụ na-alụchiri ya nwanyị. Mgbe ụfọdụ, ụmụ ada e rere n’oge gboo na-awa n’afa, nani ihe na-azọ ezinaụlọ rere ụmụada a bụ ịlụchiri ndị nwe ha nwanyị.

Alụsị nwere ike ịgwa ndị ya ka ha chọọrọ ya nwanyị ga na-ejere ya ozi. Ndị obodo ahụ nwere ike ga lụta nwanyị ma ọ bụ tọta nwanyị nye alụsị ahụ. Nke a bụ otu ụzọ mmadụ si aghọrọ osu alụsị. Eze alụsịụ ahụ nwere ike lụba nwanyị ahụ n’aha alụsi ahụ.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here