Ịlụ nwanyị na ala Igbo

0
2066
Ịlụ nwanyị na ala Igbo

Oge gara aga na oge ugbua

Uchenwa Mba

Ịlụ nwanyị n’oge gara aga dị mma n’ihi otu e si ebi ndụ n’oge ahụ. N’oge ahụ, ọ bu nne na nna na-achọtara nwa ha nwoke ma ọ bụ nwanyị onye ọ ga-alụ ma ọ bụ onye ga alụ ya. N’oge ahụ, ọ bụ ihe nne na nna kwuru ka ụmụ ha na-eme.N’ihi nke a, nwa okorobịa ruo ogo ị lụ nwanyị, nne ma ọ bụ nna ya e jiri aka ha chọba ezinaụlọ dị mma ha ga-esi chọtara nwa ha nwanyị ọ ga alụ.

Ọ bụrụ na ha hụ ezinaụlọ dị mma, ma hụ nwanyị ihe ya masịrị ha, ha e were mmanya na ọjị gakwuru ndị mụrụ nke nwanyị ahụ. Ndị mụrụ nke nwanyị jụsịa ase, ọ bụrụ na nke nwoke sitere na ezinaụlọ dị mma, ha amalite ọlụlụ di na nwunye.

N’ihi na nne na nna ha jụrụ ase nke ọma, ha ga-enye ha nkwado zuru oke.Ọ bụrụ no nsogbu a pụta,ha ga e jikọ aka ọnụ hụ maka nsogbu ahụ.

Ezinaụlọ abụọ ahụ ga-ahụ onwe ha n’anya mana egborịtara onwe ha mkpa. Nwanyị a na- alụ ga-enwe nsọpụrụ n’ebe nne di ya na nna di ya na umu nne di ya nọ. Ihe ndị a mere na alụkwaghịm adịghị n’oge ahụ ka ọ dị ugbu a.

N’ezie, ihe na eweta alụkwaghịm ka a na-ajụta mgbe ahụ ha na-ajụ ase, dị ka ezinaụlọ adịghị ebi n’udo, ndị na-ezu ori, ndị nwere ọrịa dị iche iche ma ọ bụ ndị na-adịghị asọpụrụ mmadụ. Otu a na-ajụ ase nwanyị ka a na-ajụkwa ase nwoke. N’ezie, a na-akpachapụ anya otu e si alụ di ma ọ bụ nwunye. Ezinaụlọ ọbụla na-agba mbọ ka ha ghara inwe ntụpọ n’ihi na ezi aha dị mma karịa ego.

N’ezie, di na nwunye ọbụla gbara akwụkwọ n’ụlọ ụka, ọ bụ nanị ọnwụ na-ekewa ha.Ha na-asọpụrụ nkwa ahụ ha kwere. Mana oge ugbu a, ọbụghị ezi aha ka ha na echezị maka ya . Ebe ọbụla nwoke hụrụ nwanyị, ọlọba ya, ebe nwanyị hụr nwoke, ọlụlụ ya. Ha adịghị ajụ ase n’ihi na ha adịghị akpọbata nne na nna ha na ọlụlụ di na nwunye ha. Ugbu a nwoke na nwanyị na eburu uzo biri mgbe ha aka emeghị ihe ọbụla n’isi nwanyị.

Ịlụ nwanyị na ala Igbo

Ụfọdụ na-adi ime ma ọ bụ mụọ nwa na adịbeghị ihe nwoke mere n’isi ha n’ihi na ha bi na obodo mepere emepe. Oge ụfọdụ, nke nwanyị e si be nne ya gbakwuru nke nwoke. Mgbe nne na nna ji a mara ihe mere, ha enweela nwa nwa.

Ọbụrụ na nne ma ọbụ nna sị na ha achọghị nke nwoke ma ọ bụ nke nwanyị, oge ụfọdụ, ọ bụrụ ebe ha ekwesịghị ịlụ di ma ọ bụ nwunye. Oge ụfọdụ, n’ihi ajụghị ase ma ọ bụ gaa ụlọ ọgwụ, ọbara nke nwoke na nke nwanyị abụrụ otu, nke  ga-eme na ha mụọ ụmụ, ụmụ ha e nwee nsogbu ọrịa a na-akpọ ‘sickle cell’ na ọtụtụ nsogbu nwere ike ịpụta n’ihi ajụghi ase. Mgbe ụfọdụ, ha abụọ agaghị amụ nwa.Ha  anọrọzie ịta onwe ha ụta.

Oge ụfọdụ, nke nwoke ma ọbụ nke nwanyị sitere na ezinaụlọ adịghị ebi na di, obere nsogbu pụta na etiti onwe ha, ha agbasaa n’agụghị afọ ole ha bigoro ma ọ bụ nkwa ha kwere na agbamakwụkwọ ha.Ha anaghị achọ ịma ọnọdụ ụmụ ha ga-anọ mgbe nne ma ọ bụ nna nọ iche. N’ezie, ọ bụ ajụghị ase a butere oke mgbasa.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here