Nwata ghọrọ eke

0
805
Nwata ghọrọ eke
Nwata ghọrọ eke

N’OGE bụrụ ma gboo, o nwere otu di na nwanyị nke biri ọtụtụ afọ ma ha amụtaghi nwa. Nke a mere ka ha gaa na nke dibịa ukwu na nke nta ebe ha na-achọ mkpụrụ nke afọ.

Chinwendu Uzoatu

Ọtụtụ afọ gara ma ekwe akụtaghị onye ala ji. Ma n’ikpe azụ, nwa bere n’ụlọ ha.

Nke a wetere oke ọńụ makana nwa bụ ihe a na-achọ achọ ma bụrụ ihe ikele Chineke.

Ha bidoro zụba nwa nwoke a n’ike n’ike. Nwata a malitekwara na-ebu ma na-eto. Mgbe oge ruru na nwata a ga-anọ ọdụ, ọ nọghị, mgbe o rukwara ịga ije, ọ gaghị, nke pụtara na ọ na edina ala n’ute mgbe ọbụna.

Ọnọdụ dị otu a bidoro tụba di na nwunye a egwu. Ha malitekwara gaba na nke ndị dibịa ma okwu e nweghị isi.

Oge ọbụna ha gawa ọlụ, ha na-esi nri nye nwata ahụ, ha richaa nke ha, ha eburu nke ha ga-eri ma ha lọta ọlụ dobe n’elu uko pụọ. Ha na-ahapụkwa nwa ha nwoke n’ute ebe o dina ala gawa ọlụ.

Oge ọbụna ha rụchaa ọlụ lọta, ha butuo nri ha dobere n’uko, ha ahụ na nri ahụ na e riena ya. Nke a na-agbagwoju ha anya makana onweghị onye batara n’ụlọ ha ebe ha kpochiri ya nke ọma.

Ihe a bidoro na-eme ụbọchị nile nke mere na ha amaghị ihe ha ga-eme.

Mgbe ha nọ n’ọnọdu mgbagwoju anya a ka otu anụ a na-akpọ nwaraghamgbama gwara nwanyị nwe ụlọ na ya ma ihe na-esogbu ya ma marakwa mgbe ihe nile ahụ na-eme n’ụlọ ahụ.

Nwanyị ahu rịọrọ ya ka ọ kọọrọ ya ma aragha gwara ya ka o siere ya ji mmanụ, na ọ buru na ya richaa ya, na ya ga-akọrọ ya. Nwanyị ahụ siiri aragha ji mmanụ ozugbo. Mgbe o richara ya, ọ gwara nwanyị ahụ na ọ bU nwa ya ahụ na-eri nri ha dobere n’elu uko.

GUO:  Akụkọ ifo: Ezezemali
Nwata ghọrọ eke
Nwata ghọrọ eke

Nke a gbagwojuru nwanyị a anya, o wee jụọ ya uzo o si eme nke a. Aragha gwara ya na nwata ahụ na-aghọrọ eke rigoro n’elu uko richapụ nri nile ahụ ma ridatakwa ghọrọkwa nwata dinara ala.

Nke a juru nwanyị a anya, o wee kọọrọ di ya. Aragha gwakwara ha na ha chọọ ị ma ma ihe ọ na-ekwu ọ bụ eziokwu, ha pụọ ọlụ otu ụbọchị, ha lọghachi azụ ma si na mgbawara aja nyoo ka ha hụ odum na ihe o dudu.

Nke a mere na di na nwunye a kwadochara ọlụ otu ụbọchị pụọ, ma laghachikwa azụ ozugbo ga zoo n’azụ ụlọ ha ma si n  mgbawara aja na-enyo ka ha mara ihe ga-eme. Mgbe a nọkatara, nwata ahụ ghọrọ nnukwu eke rigoro elu uko richapụ nri ahụ ma rịdatakwa ghọrọ nwata dinarakwa ala n’ute.

Nnukwu egwu tụrụ di na nwunye a nke mere na nke nwanyị chọrọ ịgba ọso ma di ya jidesiri ya ike. Mgbe nke a mechara, ha gbapụrụ ọsọ gawa na nke dibịa afa. Dibịa afa gwara ha na nwata ahụ abụghị mmadụ, na ọ bụ eke. Ọ gwara ha ka ha kuru ya gaa n’akụkụ ekwe mkpu hapụ ya. Di na nwunye a  lọtara kuru nwa ahu gaa n’ọma agụ kusa ya n’akụkụ ekwe mkpu dịka e si gwa ha.

Ha gara n’ebe tere aka na-ele anya ka ha mara ihe ga-emenụ. Ozugbo ,nwata ahụ ghọrọ nnukwu eke rịba na mkpu.

Ihe mmụta: Mmadụ kwesịrị ịma ụdị ebe ọ na-aga achọ ihe mgbe ọ nọ na mkpa.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here