Ọchịchị m emeela ka Nigeria bụrụ sọ mma – Buharị.

0
538

ONYEISI ala anyị bụ Muhammadụ Buharị emeela ka a mara na ọchịchị ya edebela ala Nigeria n’ezi ọnọdụ magburu onwe ya  ma mekwa ka ọ bụrụ obodo e ji ama atụ n’ogogo mba ụwa, na-agbanyeghị ihe iche aka mgba dị iche iche ọ na-agabiga.

Buharị mere ka a mara nke a n’okwu ya na nzukọ ndị isi ọchịchị otu ndọrọndọrọ APC nwere ụbọchị Tuuzdee n’isi ụlọ ọrụ ha dị n’Abụja, ma kwuo na obi atọgbuola ya banyere otu ọchịchị ya siri weta ezi mgbanwe na mmepe dị ukwuu na ngalaba nile nke ala anyị.

Ọ kọwara na ọchịchị ya emeela ka Naịra siwanye ike, kwalite ezi ọnọdụ akụnụba, weta ezi ọnọdụ nchekwa, ma belatakwa imefusi ma ọ bụ izofu ego ọhanaeze, na ọtụtụ mpụ na aghụghọ ndị ọzọ o gbulagoro kpam kpam, ma kọwaa na nke ahụ bụ ngosiputa na nhazi doro ya anya nke ọma.

O kwuru na ụmụafọ Nigeria kwesikwara ikele ndị gọvanọ ji aha otu ndọrọndọrọ APC achị na steeti dị iche iche na ndị ndu otu ahụ na steeti dị iche iche n’ihi ntụnye ha dị oke ọnụ. O kelekwara ndị ọrụ nchekwa, ọ kachasị ndị ọrụ agha ala anyị, bụ ndị o kwuru na ha a chụọla ndi agha ọ lụọ ọ laa Boko Haram ọsọ ụkwụ eru ala n’ala anyị.

Onyeisi ala kwuru na ndị gọvanọ ji aha otu APC achị na steeti dị iche iche emeputago ọtụtụ ihe a hụrụ anya na steeti ha ma kọwaa na otu pati ahụ na-agbanyewanye mgbọrọgwụ ugbu a n’ihi na ọtụtụ ụmụafọ Nigeria na-enwezị mmasị na ya bụ otu ndọrọ ndọrọ ugbu a, n’ihi ọtụtụ ọrụ mmepe dị iche iche ọ rụpụtagoro.

GUO:  COVID 19 - Onyeisiala agwala ndị nta akụko ya ka ha si n'ụlo na-arụgodị

Ọ kpọkuzịrị ndị otu ndọrọndọrọ ahụ ka ike ghara ịgwụ ha n’ọrụ n’ihi na ọrụ ka dị n’ihu, ma rịọkwa ha ka ha were udo hụrịta onwe ha n’anya, ma wezuga esemokwu, iji wee gaa n’ihu karịa ka ha na-aga ugbu a.

Na mbụ n’okwu ya na nzukọ ahụ, onyeisi oche otu ndọrọ ndọrọ APC n’ala anyị, bụ Mazị John Oyegun toro onyeisiala Buharị, osote ya bụ Yemi Osibanjọ, ndị gọvanọ n’okpuru APC na ndị isi ọchịchị otu ndọrọ ndọrọ ahụ maka nkwàdo ha nye ya, nakwa ịgbasi mbọ ike ha , na-agbanyeghị ihe ịma aka mgba dị iche iche ha na agabiga.

O kwuru na ahọ na-abịa abịa ga-abụ kpọọ kpọọ nyere otu ndọrọ ndọrọ ahụ, maka ihe chere ha n’ihu, tinyekwuoro nhọpụta a ga-eme na steeti Ekiti na Osun n’ọnwa Julayị na Septemba ahọ a, n’otu n’otu.

Ọ rịọkwazịrị ndị otu ahụ ka ha were otu obi hụ onwe ha n’anya, ma zeere ihe ọbụla nwere ike ibutere ha ntisa ma ọ bụ ndị kwe ma ndị ekweghị, iji hụ na ha nwetara mmeri na nhọpụta izugbe ahụ n’abịa n’ihu n’ala anyị n’ahọ 2019.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here