Ọlụ ikpochi mbize ga ebido n’Obosi na Ogidi

0
750

ỌCHỊCHỊ steeti Anambra, n’okpuru Gọvanọ Willie Obianọ ebinyela aka n’akwụkwọ ma nye ọrụ ngo maka idozi mbize (ibo) abụọ n’Obosi na n’Ogidi, dịka ụlọ ọba ego mba ụwa siri nye nkwado.

Izunna Okafor dere akụkọ ndịa

Ka ọ na-ebinye aka n’ịnye ya bụ ọrụ ngo, bụ nke weere ọnọdụ n’ebe obibi gọvanọ dị n’Amawbia, Gọvanọ Obianọ kọwara na nke ahụ ga-eme ka ọ dị isii n’ọnụ ọgụgụ, bụ ebe dị iche iche ụlọ ọba ego mba ụwa kwadogoro steeti ahụ n’ịrụ ibo, bụ ndị ọrụ malitegoro na ha; ma sịkwa na nkwekọrịta na mkparịta ụka ka na-agakwa n’ihu banyere ndị fọrọ afọ.

Banyere ya bụ ọrụ ngo, Gọvanọ Obianọ mere ka a mara na ọ bụkwa steeti ahụ ka a ga-ejide ma o nwee ihe ọbụla mere ya bụ ego ụlọ ọba ego mba ụwa wetara maka ya bụ ọrụ n’ihi na nke ahụ abụghị ego onyinye nyegara steeti ahụ, kama na ọ bụ ego mgbazinye a ga-etinye n’ọrụ ahụ, ma bụrụkwa nke ọmụrụnwa ya dị ọnụ ala.

Ọ kwuru na onye ọrụ ngo ahụ nwere ihe agafeghị ọnwa iri abụọ na anọ iji wee rụchaa ha bụ ọrụ, ma sịkwa na ọchịchị ya ga na-etinye anya oge ọbụla ma na-enyocha ịji mara ka ọrụ ahụ si aga, nakwa iji hụ na a rụrụ ya n’ụzọ ziri ezi ma rụchakwa ya n’oge kwesiri ekwesi. O gosiputakwara afọ ojuju ya nye nkweta ahụ ụlọ ọba ego mba ụwa kwetagoro ịgbata ọsọ enyemaka n’ebe dị iri na abụọ mbize na-enye nsogbu na steeti ahụ, ma werekwa ohere ahụ kpọọ oku ka a gbatakwuo ọsọ enyemaka n’ebe ndị ọzọ.

GUO:  Mbize: Ndị Ebenator ebekuola gọọmenti maka enyemaka

N’okwu nke ya, kọmishọna steeti ahụ na-ahụ maka gburugburu, ịchọ mma na ebe obibi, bụ Dọkịnta Romanus Ejikeme kọwara na inye ọrụ ngo ndị ahụ bụ nnọọ nke pụtara ihè, n’ihi ọchịchị nọ ugbu a na steeti ahụ gbasiri mbọ ike ma sochie ụlọ ọba ego mba ụwa anya iji dọta enyemaka ha na mgbata ọsọ ha, bụkwa nke e sigoro na ya we meputa ọtụtụ ihe dị iche iche a hụrụ anya na steeti a ugbu a.

N’akụkụ nke ya, onye nhazi ọrụ ahụ, bụ Mazị Michael Ifensọ kọwara na ihe kwụdosiri ike na mbọ ọchịchị Obianọ na -agba bụ iji wee nwee gburugbuu bụ ịgbà, ma sịkwa na onye ji ọrụ ngo ahụ bụ onye ụlọ ọba ego mba ụwa hiri asaa n’anya wee họpụta.

Ya bụ onye ji ọrụ ngo ahụ, bụ Mazị Frank Nnaji kwuru na ha ga-amalite ọrụ ozigbo ozigbo ma tinyesie ihe nile a ga-eji rụ mbize ahụ n’ọrụ, iji hụ na ha rụchara ma kapịa ya ọnụ n’oge kwesiri.

N’ozi ekele ya, kọmisọna na- ahụ maka akụnaụba na steeti ahụ, bụ Mazị Mark Okoye kelere Gọvanọ Obianọ na ụlọ ọba ego mba ụwa maka ezi mbọ ha na-amịta ezi mkpụrụ, ma kwuo na ụlọ ọrụ ya ga-agbasi mbọ ike iji hụ na ọrụ malitere n’ebe isii ahụ fọrọ afọ n’oge adịghị anya

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here