Uru ọlụ ugbo bara

0
2336
Ọrụ ugbo
Ọrụ ugbo

UGBO bụ ala ebe a na-azụlite nkpụrụ ihe ma ọ bụ ụlọ ebe a na -azụ ụmụ anụmanụ.

Josephine Maduakonam

Onye na akọ ma ọ bụ na alụ ihe ndị a ka a na-akpọ onye ọrụ ugbo. Ọrụ ugbo bara ọtụtụ uru. Ụfọdụ n’ime ha bụ ndị a: ọrụ ugbo na-eme ka onye na-arụ ya nwee ọrụ nke aka ya.Onye na-arụ ọlụ ugbo, agụụ a naghị agụ ya na ezinaụlọ ya. Ọrụ ugbo na-eme ka mmadụ nwee ihe akụ akụ na ihe enwe enwe. Nke a pụtara na mgbe ochie, ihe e ji ama onye ọgalanya bụ ọtụtụ nwanyị ọ nụrụ, ya na ọtụtụ ụmụaka ọ mụtakwara tinyekwara ọtụtụ ọba ji na ọba ede ya na ọtụtụ ala na akụnụba ndị ọzọ dị iche iche o nwegasịrị.

Ọrụ ugbo na-eme ka anyị na-arụpụta ọtụtụ ihe oriri dị iche iche.Ọ na-eme ka mmadụ nwee ntụkwasịobi na olile anya mgbe o chetara na ya nwere ihe oriri ya na ezinaụlọ ya ga eri. Ọrụ ugbo na-eme ka udo dị na ezinaụlọ, ọ na-ewetakwa ịfụnanya n’etiti di na nwunye nke pụtara na mgbe ihe oriri dị na ezinaụlọ, mgbakasị arụ ma ọ bụ esemokwu agaghị adị. Ọrụ ugbo na-eme ka obi ruo ezinaụlọ ala.

Ihe a na-eweta n’ubi na-enye afọ ojuju. Ọrụ ugbo na-eme ka mmadụ baa ọgaranya n’ihi na mgbe e rere ihe e wetara na ugbo, ọ na-eme ka onye ahụ nwee ego. Ọtụtụ mmadụ na-esi na ya bụrụ nnukwu mmadụ.

N’ obodo anyị bụ Nigeria, ọtụtụ obodo dị iche iche na akụkụ uwa na azụkọrịta ahịa nke ụfọdụ n’ime ha bụ mmanụ e ji akwọ ụgbọala ya na mmanụ e ji esi ihe oriri na ụfọdụ mmanụ ndị ọzo dị iche iche. Ndị ọzọ bụ ‘cocoa’ na mkpụrụ ihe a na-akọ n’ubi.

GUO:  Ọrụ Ugbo: Gọọmenti Anambra ekèéla ndị ọrụ ugbo mkpụrụ akụkụ na Neni

Ihe ndị a bụ nke na emepụta n’ala anyị Nigeria nke na akwalite akụnụba nke obodo anyị. Ọzọkwa, n’akụkụ obodo anyị bụ Nigeria, ndị Anambra na-ebupụkwa akwụkwọ nri dị iche iche na mba ụwa dị iche dịka onugbu, ụgụ, wdg. Ihe ndị a bụkwa ihe uru dị na ọrụ ugbo na-eweta, nke na-eweta ọganiru na akwalitekwa akụnụba nke Anambra Steeti.

Ọrụ ugbo
Ndị ọlụ ugbo na-alụ ọlụ n’ugbo osikapa ha.

Uru ọrụ ugbo bara karịrị akarị. Obodo na-enweghị ndị ọrụ, ugbo nnukwu ihe kwara ha, agụụ na-anyụ obodo ahụ anya oge ọ bụla. Ọrịa dị iche iche na ejupụtakwa na ya..

Ọ bụ ihe oriri akọpụtara n’ala na-enye mmadụ ike na-enyekwa ndụ. Onye ọbụla dị ndụ, ma onye ihu ma onye azụ gbadoro ụkwụ na ọrụ ugbo. Nke a pụtara na onye ọrụ bekee ma onye na azụ ahịa, ha nile dabere na ihe akọpụtara n’ala. Ọ dịghị onye ga-asị na ya a naghi eri ihe oriri.

Ọrụ ugbo dị na ụdị dị iche iche. Otu ahụ ka ihe ndị a na-arụpụta si dị iche iche. Ọrụ ugbo dị ezigbo mkpa na ndụ na ezinaụlọ  na obodo nile.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here