Amawbịa etoola Obianọ maka ịrụrụ ha ụzọ

0
479
Gọvanọ Obiano mgbe ọ na ekwu okwu na njem nleta ọlụ ụzọ ahụ.

Izunna Okafor dere akụkọ ndịa

NDỊ ogbe Ụmụeze n’Amawbịa etoola aka na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obianọ maka ịrụrụ ha ụzọ ahụ jikọrọ ha na Obinagụ n’Awka.

Ka ọ na-agwa ndị nta akụkọ okwu banyere nke ahụ, otu onye nkụzi bi na mpaghara ahụ, bụ Mazị Akụm Obi kọwara nke ahụ dịka nke bịara n’oge a tụrụ anya ya, ma tokwa Gọvanọ Willie Obianọ maka imezu nkwa o kwere ha. O kwuru na ndị Amawbia eritela ọtụtụ uru n’ọchịchị Gọvanọ Obianọ, ma rịọ ya ka ọ gaa n’ihu n’ọrụ ọma ahụ, ọbụnadị dịka ha kwere nkwa inye ọchịchị ya nkwado zuru okè.

N’akụkụ nke ya, otu onye na-azụ ahịa ma bụrụkwa onye bi na mpaghara ahụ, bụ Oriakụ Chinwe Okoli kwuru na ụzọ ahụ bụ nke nọ n’ajọ ọnọdụ wee ruo mgbe Gọvanọ Obianọ gbatara ọsọ enyemaka, ma kọwaa ya dịka gọvanọ na-arụ ọrụ na onye nwere mmetụta banyere ọnọdụ ụmụ mmadụ n’obi.

N’akụkọ dịkwa ka ibe ya, ọrụ amalitekwala n’uju n’okporo ụzọ Esther Obiakọr dị n’Ifite Awka n’ isi obodo steeti ahụ, ma bụrụkwa nke a ga-akapịa ọnụ tupu ọnwa ekeresimeesi afọ a.

Ya bụ ọrụ ngo, nke ụlọ ọrụ Sage Nig. Ltd nọ n’isi ya, bụ nke dị mita asaa na ụma atọ n’akụkụ abụọ, ma bụrụkwa nke  nọ n’ajọ ọnọdụ kemgbe wee ruo mgbe gọvanọ batara n’ọkwa ọchịchị, dịka o siri mee n’ebe ndị ọzọ dị iche iche e nwere nsogbu ụzọ na steeti ahụ.

N’okwu nke ya, otu onye bi na mpaghara ahụ, bụ Mazị Emma Agidi kwuru na Gọvanọ Obianọ na-arụsi ọrụ ike ma na-arụpụtakwa ihe a hụrụ anya. Ọ kpọkwazịrị oku ka a gbaa mbọ hụ na a rụchapụrụ ya bụ ọrụ n’oge ma ọ bụ tupu mgbe a kara aka.

GUO:  Obianọ ariọ ezi mmekọrịta n'etiti ndị okwukwe dị iche iche

Onye ọzọ, Mazị Kingsley Afọ, kọwara ọrụ ụzọ ahụ dịka nke bịara na mgbe a tụrụ anya ya, ma sị na nke ahụ ga-eme ka a kwụsị inwe oke npakọsị ụgbọala n’Ifite.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here