Andy Ụba akatọọla nkwatụ ndị Umụnze na SARS

0
617

ONYE nnọchite anya ọgbọ nta kwado Anambra ‘South’  n’ụlọ ọgbakọ sineeti ala anyị, bụ Mazị Andy Ụba akatọọla kpam kpam oke nsogbu na ịpị aka ọkpọ ahụ dapụtara n’etiti ndị ọrụ nchekwa ‘SARS’ na ụmụ okorobịa Ụmụnze n’okpuru ọchịchị Orumba ‘South’ nke steeti Anambra, ma kọwaa ya dịka nke jọgburu onwe ya.

Mazị Andy Ụba mere ka a mara nke a n’ozi ọ kụpụrụ n’isi mmalite izuụka a, site n’aka onye enyemaka pụrụ iche nye ya n’ihe gbasaara mgbasa ozi, bụ Mazị Joseph Ịtazi, ma bụrụkwa nke o sitere na ya kpọọ oku ka e nwee ezi nkwekọrịta, udo na mmekọrịta n’etiti ndị otu abụọ ahụ.

O kwuru na nke ahụ gbawara ya obi ma wutekwa ya nke ukwu oge ọ natara ozi banyere nkwatụ ahụ, bụkwa nke mezịrị ka o ziga ozi ozigbo ozigbo n’ụlọ ọrụ ọgbọ nta nkwado ya iji wee jụta ihe mere, otu ọnọdụ si gbata kwụrụ, nakwa ihe butere ya bụ nsogbu n’uju. Ọ sịkwa na ya ga-akpọtụrụ onyeisi ndị uwe ojii n’ala anyị iji wee hụ na e nwere ezi nnyocha ghe anya oghe banyere nke ahụ ma wetekwa ọnọdụ ọjọọ ahụ n’isi njedebe.

Dịka onye ọnọ mgbe o mere siri kọọ, ya bụ nsogbu bụ nke malitere na mgbede ụbọchị Satọdee gara aga, dịka ndị ọrụ  nchekwa SARS buuru ụgbọ ala ha wụchaa ma gbakọọ n’otu ebe a na-añụ mmanya, a maara dịka Guzoro, wee malite ite ndị nọ ebe ahụ añụ mmanya ure nakwa ịchọ ka ha ga-esi kpụkọsịa ndị mmadụ nọ ebe ahụ ezuru onwe ha ike, bụzị nke mere ka ụmụ okorobịa obodo ahụ nupute ma jụwapụ ya isi na o nweghị onye ọbụla ha ga-akpụ wee pụọ n’ebe ahụ.

Nke ahụ mezịrị ndị ọrụ nchekwa ahụ jiri wee kwụghepụ egbe wee kwaba mgbọ aghara aghara, nke mezịrị ka ụmụokorobịa ahụ were iwe manye ha ọgụ, nsogbu wee daa. Ka ọ dị ugbu a, a lago ndụ otu onye ọrụ SARS n’iyi, mebie ọtụtụ ihe, ebe ọtụtụ natakwara mmerụ ahụ dị iche iche, tinyere ụgbọala ndị ọrụ nchekwa ahụ a gbagoro ọkụ, na ọtụtụ ihe ndị ọzọ e megoro n’ihi ajọ ọnọdụ ahụ.

Mazị Andy Ụba kpọkuzịrị onye ọbụla ka ọ mịnye mma ya n’ọbọ ma gbaso ọnọdụ udo iji wee hụ na ya bụ nsogbu abawanyeghị, ọbụnadị dịka nnyocha na-aga n’ihu banyere nke ahụ.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here