Chinwendu Uzoatu
MINISTA na-ahụ maka njem ụgbọelu bụ Hadi Sirika e kwuola na gọọmenti etiti e nyela nkwado ya maka iwulite ọdụ ụgbọelu Enugu na Benin n’ogo njem mbe ofesi.
Onye minister a kọwara nke a oge ọ kpọtụrụ gọvanọ n’obi gọọmenti na Benin-City, Edo Steeti.
Sirika kwuru na nkwado a bụ maka ihi na ọdụ ụgbọelu elu Enugu na Benin so na ọdụ ụgbọelu ochie e nwere na ala Nigeria, tinyekwara na ogbe ahụ kwesịrị ịnwe ọdụ ụgbọelu bụ ịgba nke kwesịrị ọnọdụ akụ na ụba na-ewulite na ya.
Ọ gara n’ihụ kọwaa na ọdụ ụgbọelu ahụ bụ nke a aga-eji akarangwa kwesịrị ekwesi wee rụọ n’ime ọnwa iri na abụọ; nke bụ otu ụzọ e si ewulite ya maka njem mba ofesi.
Ọ kwuru na a hazichaala atụmatụ ị wụlite ebe ọdida ụgbọelu nke ga-agụnye akọrọngwa redio ka ọdụ ụgbọelu a wee nwee ike ịrụ ma n’ehihie ma n’abali ọ bụlagodi mgbe ọnọdụ ihu eligwe a dịchaghị mma.
Ọ gakwara n’ihu kọwaa na a ga-abawanyekwa okporo ụzọ mbata na ọdida ụgbọelu ka o wee bata ọtụtụ ihe tinyekwara ụgbọelu na-ebu ibu.
Njem ụgbọelu bụ a kwaa akwụrụ na-ejikọta azụmahịa, omenala, tinyere mba na mba. Ọdụ ụgbọelu bụ a kwaa akwụrụ na-ewete mmepe na ọganiru.
O kwuru na ha na gọọmenti steeti ndị ahụ ga-agbakọ aka wee nyụọ ya bụ mamịrị ka o wee gbaa ụfụfụ ma chawapụ n’ime ọnwa iri na abụọ. O kwuru na ọdụ ụgbọelu Benin ga-abụ e ji ama atụ.
Gọvanọ Obaseki na mmemme a, gosiri mmasi ya n’ebe gọọmenti etiti nọ maka mbọ ha n’ịwulite ọdụ ụgbọelu Benin n’ogo dị elu.