Ịgba alụkwaghịm di na nwunye

0
1704

Chinwendu Uzoatu

ỊGBA alụkwaghị m bụ nkewa di na nwunye mgbe ha enwekwaghị ike ịnagide onwe ha. Na mgbe mbụ, oge gboo, ịgba alụkwaghị m anaghị adapụtakabe n’ihi na ndị ikwu na ibe di na nwunye na-enye aka n’idozi esemokwu ọbụna dapụtaara ha. Ha na-eme nke a site n’inye ndụmọdụ, ikpe ikpe ma makwa onye ikpe mara ikpe. Ha na-agakwa n’ihu maara di na nwunye iwu ga na-achịlwa ha n’ezinaụlọ ha.

Ka o sina dị, mgbe di na nwunye enweghịkwa ike ịnagide onwe ha, otu n’ime ha nwere ike gbaa ibe ya alụkwaghị m.

Nke a na-adapụtakarị n’oge ugbu a n’ihi oke mmụta na awamanya.

Ọtụtụ ihe na-akpata ịgba alụkwaghị m, ha gunyere ịgba n’ezi, izu ohi, ịkpa nsi, amụtaghị nwa, umeọmụmụ, ịta amusu, nwoke i tị nwunye ya ihe mgbe nile, ịńụbiga mmanya oke wdg.

Nwoke chọọ ịgba nwunye ya alụkwaghị m, ọ ga-ebu ụzọ gwa umunne ya ihe nwanyi ahụ mere, ọ bụrụ na nke a ruru ihe a ga-eji gba ya alụkwaghị m, ha ga-akwado nwanne ha nwoke.

Mgbe ahụ, a ga-akpọ onye akaebe, onye akaebe dị nnukwu mkpa na ya makana ọ bụ ya ga anọkwa n’isi n’ịkpọla nwanyị ahụ.

Ọ bụrụ na nwoke gbaa nwunye ya alụkwaghị m, a gaghị akwụ ya ngọ ya ganye na nwanyị ahụ alụọ di ọzọ. Ma ọ bụrụ nwanyị gbara di ya alụkwaghị m, ya na ndị be ha ga-akwụghachi nwoke ahụ ngọ ya ozigbo n’agbanyeghị ma ọ lụrụ di ọzọ ma ọ lụghị.

Ọ bụrụ na ụmụ ha mụtara etoola, nwoke ga-akpọrọ ụmụ ya; ma ọ bụrụ na ha etobeghị, ha ga-esobe nne ha, mgbe ha tolitere, nna ha agaa kpọrọ ha. Mgbe ha na nne ha nọ, ọ bụ oke na ọlụ dịịrị nna ha ịkpagara ha nri ma ọ bụ ego nri.

GUO:  Igbochi alụkwaghịm n'etiti di na nwunye

Ọtụtụ ihe ọjọọ na-eso alụkwaghị m.Ọ na-etibi ụdọ ezi mmekọrịta dị n’ezinaụlọ abụọ ọ metụtara. Ọ na-emekwa ka ụmụaka nwoke na nwanyị ahụ mụtara ghara inwe ezigbo ọzụzụ, nke a na-eme ka akparamagwa umuaka ahụ ghara idaba nke ọma. Iji ma atụ, ụfọdụ nwere ike mụta aka ntụtụ, ịsị asị na ọtụtụ agwa ọjọọ ndị ọzọ.

Alụkwaghị m na-emekwa ka ịkwa iko bawanye maka na nwoke ma ọ bụ nwanyi o metụtara nwere ike gbabazịa n’ilo. Mgbe ụfọdụ, ọ na-eweta mmadụ inwe obi ọjọọ n’ebe mmadụ ibe ya nọ.

 

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here