Ihe e ji mara ndị ala anyị tupu ndị ọcha abịa

0
770

Uchenwa Mba

ỊGỤ akwụkwọ bụ nọọ ihe ọma nke ndị ọcha mere nye ndị isi ojii. Mgbe agụm akwụkwọ abiabeghị n’ala anyị, ihe ndị ala anyị n’alụ bụ ọlụ ubi, ikụ azụ, ịzụ ahịa, ịchụ nta, ịkpụ ụzụ, ịte nkwụ, ịkpa anụ ụlọ dị ka ehi, ewu, atụrụ, ọkụkụ. Na ọlụ ndị a nile, mpaghara ọ bụla na-eme nke ọma na nke e ji mara ha.

Ọ dịkwa ọlu ndị na eburu onye gaa n’ala ọzọ.Ọlụ ndị a bụ ịzụ ahịa na ịkpụ ụzụ.Ndị a na e buru ya gaa ahịa wee nweta ego. Ihe ọzọ ndị ala anyị na e ji enweta ego bụ mmanụ na akị nke e ji emebe ude na ncha.

Mgbe ndị ọcha bịara, ha wee malite I kuziri ndị ala anyị akwụkwọ.Ndị ọcha wetara ọlụ ọzọ dị iche iche e ji enweta ego. Ha wee maliite ịkụziri ndị ala anyị akwụkwọ. Ọlụ dị iche iche ndị a bụ ịzụpụta ndị nkuzi  ụka na nke ụlọ akwụkwọ. Mgbe  ndị be anyị malitere akwụkwọ, ndị ọcha wee nyebe ha ọlụ nke ha kpọrọ kọtụma na ọlụ  ‘clerk’.

Ndị ọcha malitere mepebe ụlọ dị iche iche dịka ụlọ ọlụ na egwu kolu e ji anya ụgbọ oloko nakwa i ji si nri, ma ụgbu a, e nwere ọtụtụ ọlụ dị iche iche n’ala anyị dịka ọlụ nke ‘office’, ebe a na emepụta ngwa ahịa, ngwa ọlụ, akwa, akpa, ihe ụkwụ, akapti, ndị na-alụ ụlọ obibi, ndị na egwupụta mmanụ eji anya ụgbọala, ọlụ ụlọ ọgwụ, ndị nkuzi ụka, ndị nkuzi ụlọ akwụkwọ.

N’oge ndị ọcha akabeghi bịa, ọtụtụ ndị ala anyị na ebi na ebe amụrụ ha rue ụbọchị ha ga-anwụ mana taa, n’ihi ọtụtụ ọlụ ndị a,ọlụ na-akpọrọ mmadụ gaa obodo ọzọ abụghị ebe amụrụ ha ha  a na-eme nke ọma ebe ahụ. Ndị ala anyị wee chọpụta na ọ bụghị nani ọlụ ugbo bụ ihe mmadu nwere ike ilụ wee dị ndụ na ọ dịkwa ọtụtụ ọlụ a na alụ alụ.

GUO:  SORO M CHIA

Ọzọkwa, n’ihi ọtụtụ ọlụ ọgbara ọhụụ a ndị ọcha webatara, ọ bụzịghị mmadu nile na-alụ ọlụ ugbo.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here