Ndị ọlụ ANPC amalite izu ụka ekpere na inye ekene

0
855

Uchenwa Mba

NDỊ ọlụ n’ụlọ mbipụta akwụkwọ akụkọ steeti Anambra a na akpọ Anambra Newspapers and Printing Corporation(ANPC) na-ebiputa akwụkwọ akụkwọ ‘National Light’ na Ka Ọ Dị Taa, nọrọ ụbọchị Mọnde  merube  mmemme i ji malite afọ, nke ha kpọrọ izụ ụka ekpere na  inye ekele. Mmemme a bụ nke e ji ekpere na abụ dị iche iche wee malite.

Onye isi ụlọ ọlụ bụ  Chuka Nnabuife kwupụtara ka mmemme ahụ ga e si ga na ọgbara na ọgbara. Ọtụtụ ndị mmadụ bịara soro ndị ụlọ ọlụ a na mmemme ịchụ aja ‘Mass’  bụ nke ndị ụkọchukwu mmadụ atọ debere. Ndị ụkọchukwu a gụnyere ‘Rev. Fr’ Tobias Osuigwe, ‘Rev. Fr’ Kingsley Okwudili Ibe na Rev. Fr Steven Echezona.Ndị ụkọchukwu ndị a bụ nọọ ndị enyi nke ụlọ ọlụ a n’ihi na ha so ha na-ebu ibu nke ụlọ ọlụ a site n’ekpere na okwu nkas obi oge gara aga.

Ụkọchukwu Osuigwe n’okwu chukwu ya n’ofufe nru ahụ, chetara  na ọ bụrụ na chineke e mere ụmụ Isreal ihe ọma,na ha na-aga Jerusalem chụọ aja ekpere ma ugbua, n’ihi na Christi abịagwo chụọ aja, ọ bụzị ekele ka mmadụ nwe inye Chukwu mgbe o meere haị ihe ọma.

Ọ chetakwara na ọtụtụ afọ gara aga, na ya na  e ti mkpu banyere ọnọdụ ụlọ ọlụ a na afụfụ ndị lagworo ezumike nka n’ụlọ ọlụ ahụ na-ata nke buteere ya ọtụtụ aha dị iche iche ma kelee Chineke maka ime  ihe ahụ dịka o siri ike ka ọ dị nfe site n’aka Gọvanọ Willie Maduaburochukwu Obiano.

Ọ sịrị na o wutere ya na mmadụ abụọ ya maara na ANPC na-aka ụka na St Thomas Aquinas nwụrụ na anataghị ụgwọ ọlụ dịka ndị ọzọ na eme taa

GUO:  Ndị ọlụ ANPC anabata onye enyemaka Obiano

Ọ gara n’ihu kwuo na inwe onye isi maara Chukwu dị mma ma chetakwa na akwụkwọ nsọ sịrị na mgbe onye ezi omume nọ na ọchịchị na ndị ọ na-achị na ańuri ọńụ.

Onye ụkọchukwu a siri n’ezie na onye isi ụlọ ọlụ a bụ Chuka Nnabuife malitere ọchịchị ya n’ime chukwu mana aga n’ihu n’ime chukwu.

Ọ gara n’ihu nye ndụmọdụ ka onye ọ bụla bụ nwa afọ Nigeria jee gbata akwụkwọ ntụli aka n’ihi na ọ bụ nke a ga egosi na ha maara ihe. ha.

Ọ gara n’ihu rịọ ndị ọlụ oyibo ka ha jiri ezi okwu na obi ọcha na-alụ ọlụ ha ma katọkwa out  ụfọdụ mmadụ si egbu ibe ha ka ha ma ọ bụ onye ha chọrọ wee nọrọ na oche ha chọrọ.

N’okwu ya ka a kasịrị ụka,onye isi ụlọ ọlụ a bụ Chuka Nnabuife kwuru n’ekpere ahụ ga-aga n’ihu ruo ụbọchị ụka a ga eweta mmemme a n’isi njedebe n’ụlọ ụka St Thamos Aquinas n’elekere itoolu n’ọkara,mgbe ndị ụlọ ọlụ a na ndị out ha lagworo ezumike nka ga-ebu ihe onyinye gaa tụọrọ Chineke mmamma.

Onye isi ụlọ ọlụ a kelere Chukwu maka ụlọ ọlụ a ma sịi na afọ 2017 siri ike mana ọ bụ afọ Chukwu jiri mere ANPC ihe nke ha na-ariọ kamgbe arọ iri abụọ na isii gara aga.

Ọ gara n’ihu kwuo ụzọ ihe asaa ụlọ ọlụ a bu n’obi n’afọ a, nke gụnyere ịlụpụta ụlọ ebe a ga anọ n’ezipụ akwụkwọ akụkọ ha n’ikuku ma ọ bụ ịhụ maka ‘website’ National Light na Ka Ọ Dị Taa, I bute igwe igwe na-ebipụta akwụkwọ akụkọ n’ụzọ ọ gbara ọhụrụ,inye ndị ọlụ  ọzụzụ na akaragwa ọhụụ ahụ aga ebụbata na I me ka  Ka Ọ Dị Taa guzoro onwe ya na ihe ndị ọzọ ga.

GUO:  ANPC atụọlara Chukwu mmamma maka ọganihu ha

Ọ sịrị na ebe ọ bụ n’anya gọọmenti adịgwo na ụlọ ọlụ a, na mgbe na adịghị anya, na ha ga-enwe ụlọ ọlụ kwesiri ndị nta akụkọ.

Nwada Chinenye Offor, otu onye  ọlụ tugworo ugo ugboro abụọ dịka out n’ime ndị kacha alụ ọlụ n’ụlọ ọlụ ahụ kenere ndị ụkọchukwu na-kwa ndị ọzọ bịara sonye na mmemme ahụ.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here