Onye Fulani ọ bụla na-achi ehi bu egbe, kpụpụ ya ụlọ ikpe – Buhari

0
737

Chinwendu Uzoatu

ONYE isi ala Nigeria bụ Muhammadu Buhari, e kwuola ka a kpụpụ onye Fulani ọ bụla na-achị ehi ji egbe ‘Ak-47’ ụlọ ikpe.

Onye isi ala a kwuru nke a na Jalingo, Taraba Steeti, oge ọ gara njem iti aka n’obi n’ebe ndị  mmadụ tufuru ndụ  ha n’ọgbaghara ahụ dapụtara ebe ahụ na nwa mgbe gara aga.

“Onye Fulani ọ bụna e jidere ka ọ ji egbe ‘AK-47’ a ga-akpụpụ ya ụlọikpe.” O kwuru nke a n’obi gọọmenti Jalingo ma kwaa arịrị maka adịghị n’otu na ka ndị ahụ e sighị nwee ike ibi n’udo dika umunne.

O kwuru na ọ ga-azọlikwa njem di otu a na steeti Zamfara na Benue ka ọ kasikwa ma tie ndị  ndị nke ha tụfuru ndụ ha aka n’obi.

Onye isi ala kpọkuru ndị ọchịchị obodo (ndị eze) na steeti ahụ ka ha kwusaa udo n’etiti ndị ha na-achị ka ha wee nwee ike inwe ezi mmekọrita.

Ọ gara n’ihu kwuo na ndị ọchịchị obodo na Nigeria bụ isi a hụrụ kwaa okpu ebe ndị ndọrọndọrọ ọchịchị dika ya onwe ya bụ onye isi ala na Gọvanọ Dairus Isaku nke Taraba Steeti bụ ndị ọbịa ndị n’agahị anọgide n’oche ọchịchị ha rụọ ebighebi.

“Onye Fulani ọ bụla e jidere ka o ji egbe ‘AK-47’ a ga-akpụpụ ya ụlọikpe. Ụnụ bụ ndị ọchịchị obodo ga-anọgide n’oche ọchịchị ụnụ ruo n’ọnwụ; eleghi anya ishiakụ (gọvanọ) na mụ onwe m a gaghị anogide n’oche ọchịchị ogologo oge, mana ụnụ ga-anogide na ya ruo n’ọnwụ.

 

Ndị nọchitere anya agbụru Yandan, Fulani na Mambila bụ ndị kwuru okwu n’ọgbakọ a kpọkuru onye isi ala ka o guzobe ikpemkwụmọtọ n’ala ahụ ka ndị mmadu wee bie n’udo”.

GUO:  Ụmụnwanyị Delta emeela ngagharị iwe maka ndakpo ndị na-achi ehi na-adakpo ha n'ike

N’okwu ya na mbụ, gọvanọ na-achị Taraba Steeti bụ Dairus Ishiaku gosịrị mmasị ya otu onye isi ala si wepụta oge bia na steeti ahụ maka iti aka n’obi.

Ishiaku gara n’ihu kwuo na nsogbu dị na steeti ahụ gbochiri mmepe na ọganihu na atụmatụ ọma di iche iche nke gọọmenti steeti ahụ malitere na mbụ.

Ọ rịọkwara onye isi ala ka ọ hibekwuo ezi nchekwa na steeti ahụ iji gbochie nsogbu ọzọ.

 

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here