A tụọla mmadu iri abụọ na abụọ nga maka ọgwụ ike n’Anambra

0
786

‘NDỊ ọlụ ‘National Drug Law Enforcement Agency (NDLEA)’ ekwuola na mmadu ọnụ ọgụ ha dị iri abụọ na abụọ ka a mara ikpe ma tụọ ha nga n’ihe gbasara ọgwụ ike site n’agbata Jenuari, 2017 ruo Febuari, 2018.

By Chinwendu Uzoatu

Onye bụ onye isi ya bụ ụlọ ọlụ na steeti Anambra bụ Mazi Sule Momodu,bụ onye kwuputara nke a n’Awka, kọwara na a mara ha ikpe maka na ha ji anwụrụ ike di iche iche dịka ‘cocain’, ‘heroin’ wdg.

A tụrụ ha mkpọrọ nke sitere n’ọnwa iri na abụọ ruo n’afọ asaa dika ihe onye mere siri di.

Onye isi NDLEA kọwara na mmadu iri na iteghete bụ ndị e jidere n’afọ 2017 ebe mmadụ atọ bụ ndị 2018.

Ọ gara n’ihu kwuo na ya bụ otu a gaghi ańụ mmiri tọgbọ iko ganye na ha ahụ na e nweghịkwa ụdị ndị ahụ na steeti a.

Mazi Momudu gara n’ihu kpọkuo ndị ụka na ndị ọchịchị obodo ka ha nye aka na ya bụ agha ịchụ ọgwụ ike ọsọ ụkwụ eru ala.

O toro goomentị steeti a maka mbọ ha na nkwado ha n’ebe otu a nọ.

GUO:  Obianọ akpọọla oku ka a kwalite asụsụ Igbo

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here