ANPC atụọlara Chukwu mmamma maka ọganihu ha

0
902
Ndi olu ANPC
Onye isi ụlọ ọlụ ANPC, Chuka Nnabuife (nke ise n'aka nri), onye n'alụgọdụ ọlụ ka 'Editor' National Light na Ka Ọ Dị Taa, Rose Oranye (nke atọ n'aka ekpe) na ụfọdụ ndị ọlụ ha ka-agbasara ụka ịtụ mmamma ahụ.
  •  Kelee Chukwu maka ụgwọ Obiano n’akwụ ndị lara ezumike nka na ụlọrụ ha

ỤBỌCHỊ ụka ọnwa Maachị dị na mkpụrụ ụbọchị iri na otu bụ nnọọ ụbọchị Chineke gọziri agọzi ma bụrụkwa ụbọchị oke ọńụ n’ebe ndị ọrụ na ndị lagoro ezumike nka n’Anambra Newspapers and Printing Corporation, ndị na-ebipụta akwụkwọ akụkọ National Light na Ka Ọ Dị Taa.

Chinwendu Uzoatu na Josephine Maduakonam

Sir Chuka Nnabuife, ‘Managing Director’ ụlọ ọrụ a na ndị ọrụ nile, ma ndị lagoro ezumike nka, tinyere ndị enyi na ndị na- echere ha ezi echiche nukọọrọ gaa n’ụlọ ụka ‘St Thomas Aquinas Catholic Church’ Awka, gaa tụọrọ Chineke mma mma maka ọrụ ọma ya n’ebe ha nọ.

Adịlarịị na mbụ malite nke a site n’ikpe ekpere n’ụlọ ọrụ a, ebe ndị ụkọchukwu bịara ma gọzie ebe nile.

E kwuru na eri oge gara aga, ọ dịbeghị mgbe a kwụrụ ndị rụrụ n’ụlọ ọlụ a ma laa ezumike nka ụgwọ dịka a na-eme ibe ha. Ọnọdụ dị otu a mere ka ha nọrọ n’ekpere kamgbe maka na ọ bụ e mee nwa ka e mere ibe ya obi adị ya mma.

Ma ka ọ dị ugbua ,aka na-achị Anambra Steeti bụ Chiefu Willie Obianọ e meerela ha ka ya bụ ihe di wọrọ ogori zụọ n’ahịa. Ọńụ wee jụpụta ha obi makana enye nwata ihe tụrụ ya n’anya, ọ sị ma e nyere ya nye onye.

Ka ọ dị ugbua, a kwụchaala ndị nile rụrụ ọrụ n’ụlọ ọrụ a bụ ndị lagoro ezumike nka ụgwọ nile ruturu ha. Nke a ka ha ji were otu olu kwee Amen. Ka otito diri aha nso nke Chineke.

GUO:  Ndị ọlụ ANPC anabata onye enyemaka Obiano
Ndi olu ANPC
Onye isi ụlọ ọlụ ANPC, Chuka Nnabuife (nke ise n’aka nri), onye n’alụgọdụ ọlụ ka ‘Editor’ National Light na Ka Ọ Dị Taa, Rose Oranye (nke atọ n’aka ekpe) na ụfọdụ ndị ọlụ ha ka-agbasara ụka ịtụ mmamma ahụ.

N’ụlọụka St Thomas Aquinas dị n’Awka, Ụkọchukwu nọrọ n’isi emume bụ ‘Rev Fr’ Paschal Ndeze CSSP.

N’okwuchukwu, ọ gwara ndị mmadụ ka ha na-ahụta Kraist n’ime mmadụ ibe ha. Ọ gakwara n’ihu nye ndụmụdụ ka ndị otu Kraịst na-elekwasa ya anya mgbe nile  ọbụladị n’oge ọnwụnwa.N’ikpeazụ, o keiere Chineke maka ụlọọrụ ‘Anambra Newspaper and Printing Corporation’. Ọ kpọkuru gọọmentị ka ha jisieike n’ọrụ.

Mgbe a gbasara ụka, ọtụtụ ndị mmadu soro wee lota n’ụlọ ọrụ a, ebe a nọrọ mee oriri bịam bịam n’ọnụ site n’ikụ ngazị n’eze ma were olilo mmanya dị iche iche gbaara ya ụgbọ.

Ọtụtụ ndị mmadu bịara ma nye ndụmọdụ na nkọwa dị iche iche tinyekwara ndị ‘National Light Art House’ bụ ndị mere ihe emereme dị iche iche iji mee ndị mmadu obi ụtọ,tinyekwara onye ọgụ egwu aha ya bu Urch,nke isi egwu ọ gụrụ bụ Amandianaeze.

Sir Chuka Nniabuife bụ onye isi National Light ji obi ańụrị nabata mmadụ nile.Ọ kọwara na ọ bụ ụbọchị oke ọńụ ma kwukwa na ha na-aga n’ihu na-anwa oke ha iji hụ na akwụkwọ akụkọ National Light na Ka Ọ Dị Taa bụ eji ama atụ.

Ben Emodi bụ onye ọrụ lagoro ezumike n’ọrụ n’Anambra Steeti toro akwụkwọ akụkọ ndị a ma kwuo na ndị Igbo ga-anabata akwụkwọ akụkọ Ka Ọ Dị Taa n’ihi na e ji asụsụ Igbo wee na-ede ya.Ọ gara n’ihu kwuo na nke a ga-akwalite asụsụ Igbo.

‘Sir’ Hyacinth Nweke, onye jibu ọkwa dịka Kọmishọna n’Anambra Steeti kwuputara obi ańụri ya n’ebe ndị ọrụ National Light lara ezumike nka nọ.

GUO:  Ndị ọlụ ANPC amalite izu ụka ekpere na inye ekene

Ọ gara n’ihu site n’ikele Sir Nnabuife maka mbọ ya; tinyere ezi mmekọrita dị n’etiti ya na ndị ọrụ ya. Ọ jara ya ike dịka ọ na-ezipụta ndụ ya dịka onye otu Kraist, ma tokwaa akwụkwọ akụkọ Ka Ọ Dị Taa.

‘Sir’ Tony Otikpa, onye isi otu ndị ọkwa nka na Nigeria ‘Society of Nigeria Artists’ ngalaba Anambra Steeti, kụziri Sir Nnabuife mgbe ọ nọ n’ụlọ akwụkwọ kelere ya  maka mbọ ọ gbara iji hụ na e kpochara ụlọ ọrụ ha iji mee ka ebe nile dị ọcha.

Onye bụ onye ọkwa nka nke ụbọchị ahụ bụ Henry Obidiegwu,  gosipụtara ọtụtụ ihe ndị ọ mepụtara.

N’ikpeazu, Editor akwụkwọ akụkọ National Light na Ka Ọ Dị Taa bụ Oriakụ Rose Oranye nyere ekele ikpeazu. O kelere onye isi ụlọ ọrụ ha bụ Sir Chuka Nnabuife, ndị ọrụ nile tinyere ndị niile biaranụ. O kelere ndị  nyeere ha aka wee kpee ekpere maka ya bụ ịkwụ ndị nile lara ezumike nka n’ụlọ ọrụ ahụ ụgwọ ruuru ha.

E ji ekpere were weta ọnọdụ a na njedebe. Chidi Okoye gwara ndị ọrụ ka ha makuo Chineke ma rụọ ọrụ ha nke ọma.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here