Ihe mere nwanyị ejighị agba afụọnụ

0
1441
Nwanyị Loro Akwa Eke
Akụkọ Ifo

By Chinwendu Uzoatu

N’OGE gboo, mgbe elu bụ ala ọsa, ma ụmụnwoke ma ụmụnwanyị na-agba afụọnụ.

  N’oge ahụ,o nwere otu agadi nwanyị aha ya bụ Mmaakụ. Nwanyị a wara anya ma na-akpa agwa ka nwoke. Afụọnụ ya buru ibu ma tokwaa ogologo.

Ndị obodo ha nwere oke mmemme ha na-eme afọ ọ bụla. Ya mere ka ha na-eme mmemme a, eze obodo ahụ pụtara gbaa egwu. Mgbe ọ gbachara egwu, o bidoro chọba ọla edo ọ na-agba n’aka achọ.  Ọla aka a e ji ọla edo wee mee nke eze na-agba n’aka bụ ebe amamihe ya nọ.

Nke a pụtara na eze agaghị achịlị obodo ma o jighị ọla a.Ewu na ọkụkọ malitere chọba ọla eze a n’ike n’ike ma a hụghị ya. Eze sokwa na-achọ. N’ihi nke a, e bute ikpe n’obi eze, ọ gaghị amakwa ihe ọ ga-ekpe. Eze kwere onye ọ bụna ga-achọta ọla a nkwa ihe akụ akụ na ihe enwe enwe.

Otu ụbọchị, ka nwa odibo Mmaaku na-aga nkụ wee tụụta ọla, o maghị ihe ọ bụ o wee wegara nne ya ukwu. Nne ya ukwu matara na ọ bụ ọla eze ahụ a na-achọ achọ wee nara ya nwata ahụ zoo. Ebumnuche ya bụ mgbe nwa ya nwoke tolitere ka o nye ya ka o were bụrụ eze. N’ihi anya ukwu ya,o gosịghị dị ya ọla ahụ.

Mgbe a chọkatara ọla a ma a hụghị ya, eze gara na nke dibịa afa ga gbaa afa. Dibịa gwara ya na ọla ahụ dị n’obodo ya, na mmadu zuuru ya.

Eze nyere ndị agha ya iwu ka ha ga chọba ọla ahụ n’ụlọ n’ụlọ. Mgbe a chọchara ma a hụghị, eze gaghachiri azụ ga gbakwa afa ọzọ.

GUO:  Akụkọ ifo: Ezezemali (3)

N’oge a, dibịa gwara ya ka o si n’ebe ụmụnwanyi nọ chọọ ya. Ndị agha ya gara chọchaa a hụghị, ọ gaghachie azụ gbaa afa nke ugboro atọ, a gwa ya na o nwere nwanyi a chobeghi ya n’ụlọ ya.

Oge a, eze kpọrọ ndị agha ya jụọ ma o nwere nwanyi ha achọghị ọla ahụ na be ya, ndị agha ya gwara ya na ha achọghị ya na be Mmaaku n’ihi nsọpụrụ ha nwere ebe ọnọ, nke ọzọ wee bụrụ na ọ bụ ezigbo okenye na ha eleghi anya na ọ ga-ezu ohi.

Eze nyere ha iwu ka ha gaa n’ụlọ ya ozugbo ga chọọ ọla ahụ. Mgbe ha ruru n’ụlọ ya, ha kwaghachara ebe nile ma ha ahụghị ọla ahụ. Ha chọrọ ọla ahụ abali atọ na be ya ma ha ahụghị ya.

Mmaakụ bidoro mebe ọnụ. N’ihi nke, a ọ pụtara na mbara be ya na-agba egwu iji gosi na aka ya dị ọcha. Mgbe ọ na-agba egwu, ọla eze si na nnukwu afụọnụ ya dapụta bụ ebe o zoro ya. Nke a wee rie ndị mmadu ọnụ. Ike wee gwụ di ya.

Eze jiri iwe nye iwu ka Ezemmụọ obodo ahụ  kpụọ Mmaakụ afụọnụ. Mgbe e mechara nke a, o nyekwara iwu ka a kpụọ ụmụnwanyi nile afụọnụ.

Ezemmụọ were nsi mbe tee n’agba ụmụnwanyị nile ma kwubie okwu na ụmụnwanyi agaghizi na-agba afụọnụ.

Bido ụbọchị ahụ gawa, ụmụnwanyi anaghịzị agba afụọnụ, sọọsọ ụmụnwoke na-agba afụọnụ.

 

Ihe mmụta: Oke ọchịchọ adịghị mma.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here