Nwokorobịa e gbuola nna ya n’Abatete

0
623

OTU nwokorobịa gbara afọ iri abụọ na asaa asụgbuola nna ya. Aha nwokorobịa a bụ Ifeanyi Ogụejiọfọ, onye nke e kwuru na ọ bụ onye ji ọgbatumtum (Ọkada) akpa ihe ọ na-eri. Aha nna ya, onye nke o dulara mmụọ n’ike bụ Mazi Joseph Ogụejiọfọ.

Chinwendu Uzoatu

Ọdachi a dapụtara na be ha bụ Ezimuku Abatete nke dị n’okpuru ọchịchị Idemili North na steetị Anambra. Ihe anya mmiri a bụ nke a sị na ọ dapụtara ka ya na nna ya na – agbagha mgbagha n’ihi na ọ na- ana nna ya ego ka o wee goro ọgbatumtum ọhụrụ.

E kwuru na Mazi Oguejiofo bụ onye ji ego achụ nta ego n’Ọnitsha mana ọdachị a dapụtara oge ọ lọtara ụlọ ka ọ hụ ndị be ya, ma bụrụzie onye nwa ya nwoke dulara mmụọ n’ike.

Ọnye kọwara ka o si mee kwuru na ọ sụrụ nna ya mma ọtụtụ ugboro oge nna ya gara n’ihu na- agwa ya na ya ejighi ego n’ihi na ya onwe ya na-achọ ego ọ ga-eji gbanwe njini ọgbatumtum nke ya.

Nwokorobịa a, onye nke e kwuru na ọ na-ańụ igbo sụkwara nne ya mma oge ọ bịara igbochi ya.

Ifeanyi gakwara n’ihu ịsụ onwe ya mma, eleghị anya ka o gbuo onwe ya mgbe ọ chọpụtara na mmiri a ńaana garị.

Nne ya, ma bụrụkwa nwunye onye e gburu egbụ, Ọriaku Josephine Oguejiọfọ, kwuru na nwa ha nwoke a nọ na-ana ha ego eri oge. Ọ bụ n’ihi na ha enweghi ike inye ya ego ka ihe arụ a ji wee dapụta.

Ụfọdụ ndi obodo kwuru na mgbe Ifeanyi gbuchara nna ya, ọ gara n’ arụsi dị n’ihụ ụlọ nna ya wụsa ọbara nna ya.

GUO:  Otu nwaanyị egbuola di ya maka akwamiko, bere ya amụ

Ka ọ dị ụgbụ a, aka ndị ụweojii ‘Abatete Police Division’ akparala ya site n’enyemaka ndị agbataobi ndị gbatara oge nne ya tiri mkpu ma mee ka ọha na eze mata njinji jirinụ.

Ọde akwụkwo mgbasa ozi ‘Anambra State Police Public Relations Officer’, ASP Nkiruka Nwode, oge a kpotụụrụ ya kwetere na a nwụchịkọọla nwa amadị ahụ; na ka ọ di ugbu a, e bidola ime nnyocha gbasara okwu ahụ.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here