Ọ dị njọ ịnapụ ndị ọlụ nchekwa egbe ha – Igbo Ekunie

0
749
otu 'Igbo Ekunie

Izunna Okafor

OTU jikọtara ndị Igbo e ji okwu ha agba izu n’ala Nigeria na mba ofesi, bụ otu ‘Igbo Ekunie’ adọọla aka na ntị banyere iwu ahụ onyeisi ndị uwe ojii n’ala anyị bụ Ibrahim Idris nyere nso nso a ka a napụtasịa onye ọbụla nọ na mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ ala anyị egbe na ngwa agha ndị ọzọ ha nwere.

Site n’okwu ahụ ha kwuru n’Onitsha na steeti Anambra na nsó nsó a,onyeisi ndị otu a bụ Mazị Tochukwu Ezeoke na ode akwụkwọ ha bụ Mazị Lawrence Nwobu kọwara na e nwere ọtụtụ ihe egwu dị na ntuzi aka ahụ, ọ kachasị nke a ọ bụ na udo gbazịrị ọsọ n’ala anyị, ebe agbụrụ na okpukperechi dị iche iche n’ala anyị ejighịzịkwa anya ahụta ibe ha,tinyekwuziere na ọnọdụ nchekwa debezịrị ihu na ọnụ ka ntọọ n’ala anyị ugbu a n’ọchịchị Muhammadụ Buharị.

Ha kọwara na ala Nigeria ugbu a bụ ‘onye na nwanne ya so ma egwu atụ ya’ ma gbaduzie ụkwụ n’ọtụtụ ihe egwu dị na ntụzi aka ọkụ ọkụ ahụ wee kpọkuo gọọmenti na ndị ọ dị n’aka, ka ha mee ngwa ngwa kagbuo ma wezuga ntụzi aka ahụ n’otu akụkụ.

otu 'Igbo Ekunie

Ha kwara arịrị na a na-ekwu na ndị Igbo enweghị nnochite anya zuru oke n’ebe o metụtara ndị isi ọrụ nchekwa n’ala anyị, tinyekwuoro otu ndị oji eze ata ede ndụ, bụ ndị Fụlani na-achị ehi si egbusi ndị mmadụ n’ebe dị iche iche n’ala anyị, e wee na-ekwukwa okwu ịnapụsị ndị ndị ọrụ nchekwa na ụmụ mmadụ obere ihe ọ bụ mmadụ jikwa akasi ibe ya obi.

Ndị ndu a rụtụrụ aka na ntụziaka ahụ enweghị ezi nkwado nke uche zuru okè, dịka o metụtara mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ ala anyị n’ihi na ọnọdụ nchekwa dị ntị mma na mpaghara ụfọdọ karịa na mpaghara ndị ọzọ n’ala Nigeria, tinyekwuoro na onyeisi ndị uwe ojii n’ala anyị aghọtaghị na ndị ọrụ nchekwa ime ime obodo ọ na-ekwu ka a nasịsịa egbe bụkwa ndị na-enyere ndị ọrụ uwe ojii aka n’ọrụ ha ma bụrụkwa ndị ya na ha na-arụkọ ọrụ. Ha kwukwara na ndị ọrụ nchekwa dị otu ahụ bụkwa ndị e guzobere site n’aka gọọmenti nakwa n’usoro iwu, ma bụrụkwa ndị na-enye aka n’ụzọ pụrụ iche n’iweta udo, nchekwa na mmezuputa iwu n’ime ime obodo, n’ọma ahịa na ebe ndị ọzọ dị iche iche.

Dịka o siri metụta ọnọdụ nchekwa n’ala anyị ugbu a, ndị otu a chetaara onyeisi ndị uwe ojii ahụ na ihe kwesiri ịdị na-echu ya ụra ugbu a kwesiri ịbụ otu a ga-esi wee weta n’isi njedobe, arụrụ ala na nkwafu ọbara ahụ nke ndị Fụlani na-achị ehi na-akwafu na otu ha si ebibi akụnụba na ihe ndị ọzọ na steeti Benue na ebe ndị ọzọ ha na akpa ike, karịa inye iwu ka a nasịsịa ndị ọrụ nchekwa egbe na ihe ndị ọzọ ha ji arụ ọrụ.

Na mmechi okwu ha na ịdọ aka na ntị ha, ndị Igbo Ekunie

jikwazịrị olu nkọwa wee mee ka a mara na ndị ọrụ nchekwa ji egbe na ngwa ọgụ iwu emegideghị abụghị ha na-eweta ala adịghị mma na igbusi mmadụ a na-ahụta n’ebe dị iche n’ala anyị, ma kpọzie ndị ọ dị n’aka ka ha lebara nke ahụ anya iji hụ na a napụghị ha ihe ndị ha ji arụ ọrụ ha, n’ihi na nke ahụ ga-akpụtọkọ ma wetakwa ajọ ọnọdụ nye nchekwa. n’ala anyị, karịa ka ọ dị ugbu a.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here