Obianọ akpọọla oku ka a kwalite asụsụ Igbo

0
956
Asusu Igbo

AKA na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obianọ akpọọla oku ka onye ọbụla bụ ezi nwa afọ Igbo tinye aka ma tụnye ụtụ nke ya n’ịkwalite njirimara, asụsụ na omenala Igbo iji wee hụ na ọ nwụnyụghị ma ọ bụ funahị ndị nwe ya, dịka e buru n’amụma.

Izunna Okafor

Gọvanọ kpọrọ oku a na mmemme ịkwalite omenala Igbo, nke ahọ 2018, bụ nke a chịkọbara site n’aka ụlọ akwụkwọ Igwebụike dị n’Awka.

Ya bụ mmemme bụ nke a na-achịkọba kwa ahọ ọbụla ma bụrụkwa nke a nọrọ na ya wee gbaa egwu ọdịnala dị iche iche, gbaa ekpo, mee ejije, sọọ mpi, gosi ihe ngosi dị iche iche, tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ e mere, bụkwa ụzọ e si akwalite ịma mma na ọnatarachi nke agbụrụ Igbo.

N’okwu ya na mmemme ahụ, Gọvanọ Obianọ, nke onye nọchitere anya ya bụ onye nọgodi dịka onye mgbàzi n’ụlọ ọrụ steeti ahụ na-ahụ maka ihe na-eme na mba ofesi, omenala na njem nlegharị anya, bụ oriakụ Nkiru Melụdu, gosipụtara obi añụrị ya banyere ọmarịcha atụmatụ ahụ, ma kpọkuo ha ka ha jigidesie ya ike. Ọ kọwara ụlọ akwụkwọ na ụmụakwụkwọ dịka ndị nwere ọrụ pụrụ iche na ntụnye dị oke mkpa a na-atụ anya n’aka ha iji chekwaba ma kwalite ya bụ asụsụ Igbo ka o wee ghara ịnwụnahị ndị Igbo, ma kpọọ oku ka onye ọbụla tinye aka n’ọrụ.

N’okwu nke ya, onyeisi ụlọ ọrụ na-ahụ maka agụm akwụkwọ ogo sekọndịrị bụ P.P.S.C. na steeti ahụ, bụ Lady Joy Ụlasị kọwara asụsụ Igbo dịka nke dị mkpa na ndụ onye Igbo ọbụla, ma nyezie ndụmọdụ ka onye ọbụla kpọrọ onwe ya ezi nwa afọ Igbo tinye aka n’ọrụ, n’ezi mbọ ahụ a na-agba iji kwalite asụsụ na omenala Igbo.

GUO:  A tụọla mmadu iri abụọ na abụọ nga maka ọgwụ ike n'Anambra

Asusu Igbo

Na mbụ n’ozi nnọọ ya, onyeisi ụlọ akwụwkọ ahụ, bụ Dọkịta Anaekeokwu kọwapụtara ụfọdụ uru dị iche iche asụsụ na omenala bara, na otu o siri kwesi nkwalite, ma kọwaa na nke ahụ dịka ihe mbụ nyere ha mkpali ha ji achịkọba ma na-ahazi mmemme dị otu ahụ.

Na ntụnye ha n’otu n’otu, eze ọdịnala Nibo bụ Igwe Micheal Ngene na ogbo ya nke Ezinatọ, bụ Igwe Timothy Ezenwaka kpọkuru ndị Igbo ka e chekwaba ihe ọkpụ dị iche iche e jiri mara ndị Igbo, bụ nke a kọwara na ọ na-alazị ala ugbu a. Ha rịọzịkwara ndị nkụzi ka ha were ya kpọrọ ihe, bụ ịhụ na nwata akwụkwọ ọbụla ma otu e si asụ ma na-ede asụsụ Igbo, karịa inye nwata ọbụla ntaram ahụhụ, naanị maka na ọ sụrụ asụsụ Igbo.

Oke mmemme ahụ  dọtara ọtụtụ ndị sitere na ngalaba dị iche iche na steeeti ahụ, ma bụrụkwa nke a nọrọ na ya wee tụọ ndụ mmanụ site n’iri ụdị nri ndị Igbo dị iche iche nakwa mmanya ngwọ na nkwụ elu e jiri wee gbanyere ya ụgbọ nwa mkpi.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here