Ọchịchị Obiano: Ihe na-atọkarị m

0
657
Ochihi Obiano
Gọvanọ Obiano (nke mbụ n'aka ekpe), mgbe ọ na enyefe ọtụtụ ụgbọala n'aka ndị ọlụ nche iji kwado ọlụ ha.

Uchenwa Mba

OTU ihe kachasị mma n’ọchịchị Gọvanọ Willie Obiano na steeti Anambra bụ out ndị ọlụ nche ohibere ozigbo ọ batara. Nke a gosiri na ndụ na akụ na ụba ndị ọ na-achị di ya ezi mkpa. N’ezie, nchekwa ndụ na akụ na ụba ndị mmadu bụ nnọ ihe ezi onye ọchịchị ọ bụla kwesịrị imere ndị ọ na-achị.Ọ bụ nke a mere na ezigbo gọọmentị ọ bụla na amapụta akata mkpo ego buru ibu iji mee ka otu ọlụ nche bụrụ ihe na-aga nke ọma.

Ilebaa anya nke ọma na ọchịchị, ịga ahụ na ihe dị iche iche dị n’afọ ise ma ọ bụ anọ gara aga. Ugbu a ndị Anambra na emechi anya ha abụọ ma chi jie, akụ na ụba ha dịkwaara ha.N’ihe dịka  arọ ise gara aga, onodu ndị Anambra bụ ihe adịghị ekwu n’ọnụ maka ajọ ihe a na eme n’ime ya dịka izu ori, itọ mmadụ, imakwasa nwanyị n’ike na ihe ọjọọ ndị ọzọ.Nke a mere n’akụkụ Nigeria anyi nile, Anambra bụ ebe a na-atụ egwu. Ndị oji ego achụ ego na-atụ egwu ibata.Igbụ mmadụ na ịtọ mmadụ bụkwa ihe a na-anụ mgbe nile.Nke a mere na ndị ji ezigbo ego na Onitsha na Nnewi na-anọ n’egwu mgbe ọ bụla maka igbu ha ma ọ bụ tọrọ ha. Mana taa, ọdịghịzị otu ahụ. N’oge ahụ, ndị na-anya ụgbọala nke a na akpọ ‘luxurious’ na-atụ egwu ịgba ụzọ Anambra n’ihi ọtụtụ ndị n’agba ụgbọala na ndị ọzọ ha e gbugoro n’ụzọ Anambra. Ụzọ Upper Iweka bụkwa aga-aga n’ụtụtụ ma ọ bụ n’ehihie.Ọ dịghị onye na-emekpa ndị ọjọọ a arụ. Ọ bụna ndị Uwe Ojii amaghi ihe ha ga-eme ha n’ihi na ngwa agha ndị ọjọọ a karịrị nke ha ji nke ukwu.

GUO:  Amawbịa etoola Obianọ maka ịrụrụ ha ụzọ

Chukwu wee malite ịzọpụta ndị Anambra site na mbata onye isi, Willie Maduaburochukwu Obiano batara n’arọ anọ gara aga wee chụọ ndị ekperima ọsọ ọkpa eru ala na Onitsha, Nnewi nakwa akụkụ nile nke Anambra Steeti. Ka ọ batarasiri, o wee wepụta usoro nchekwa pụrụ iche nke gụnyere ọlụ ndị nche nile dika ndị uwe oji, ndị navy, ndị army, civil defence, NDLEA, Ocha Brigade, tinyere ndị nche  ogbe ọ bụla.Ha nile wee wepụta amamihe na nkuzi enyere ha tupu ha ebido ọlụ.

ochichi Obiano

Ochihi Obiano
Gọvanọ Obiano (nke mbụ n’aka ekpe), mgbe ọ na enyefe ọtụtụ ụgbọala n’aka ndị ọlụ nche iji kwado ọlụ ha.

Nkea mere na ezi echiche nke Obiano pụtara ihe nke ọma ruo taa. Ndị ekperima nile wee gbapụ ọsọ n’ihi na enweghizi ebe ha ga anọ. Ugbua, ndị Anambra na eghebe ụzọ ha oghe wee na alaru ụra. Otu n’ime ngwa agha e jiri buo agha a ojiri gaa nke ọma bụ ụgbọ elụ nke akpọrọ ‘helicopter’ bụ nke na-efegharị ebe nile mepere emepe n’oge mmemme dịka ‘Christmas’ ma ọ bụ ‘Easter’.

Ndị Anambra bi ebe ọzọ adịghị atụkwazi egwu ilata obodo nke aka ha.Ọzọ, ọ bụnadi ndị bi mba ofesi na alata mgbe ha chọrọ. N’oge gara aga, ndị Anambra ji ego ha chọọ ibata, ha agaghi achọ ka amara na ha batara.Ụfọdụ a gaghị ebu ezigbo ụgbọala ha nwere na ebe ha bi mana n’ihi ezigbo ndị ọlụ nche nakwa nchekwa enwere ugbua ,onye ọ bụla, ndị o ji ego achụ ego, ndị a maara aha ha, ndị nọ n’ụlọ ma ndị puru ije na ejegharị mgbe ọ bụla ha chọrọ.

Ọzọ dika ibe ya aka n’achị steeti mere bụ na o wetara udo na ezi mmekọrịta na etiti obodo na obodo n’ Anambra. Ọchịchị ya mere ka ndị eze odinala na ndi ha n’achị nwee udo na ezi mmekọrịta.Ebe udo  na ihunanya dị ka ọganiru na-adị.

GUO:  Obianọ abàgide n'itute amụma ịgba mmiri n'ubi

N’ezie, ọ bụ Gọvanọ Obiano bụ onye izizi chịkọbara nkuzi maka ọlụ nche nye ndị ‘South East’ steeti nakwa Delta .Nke a welitere aka n’achị steeti elu nke ọma na obodo anyi bụ Anambra.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here