A tọhapụla ụfọdụ ụmụnwnayi ndịakwụkwọ Dapchi

0
520
Ụfọdụ n'ime ụmụakwụkwọ Dapchi ahụ a tọhapuru na ngwongwo ha bụ lọta.

A KỌWAALA na dịka ihe siri gbata kwụrụ ugbu a, na ụmụakwụkwọ dị iri asaa na isii n’ime mmadụ otu narị na iri, bụ ndị a tọọrọ n’ụlọ akwụkwọ “Government Girls Science and Technical College, Dapchi” nke steeti Yobe n’abalị iri na iteghete nke ọnwa Febụwarị ahọ a, abụrụla ndị nweere onwe ha site n’aka ndị tọọrọ ha, bụ ndị agha iyi egwu Boko Haram.

Izunna Okafor

 

Onye okwuputa okwu onyeisi ala Muhammadụ Buharị, bụ Mazị Garba Shehu mere ka a mara nke a, ma gbakwa aka ebe banyere nke ahụ n’ụtụtụ ụnyahụ. Dịka o siri kwuo, akụkọ kọrọ na ndị ahụ bụ ndị e bughachitere site n’aka ndị ọjọọ ahụ tọọrọ ha wee bịa wụhapụ ha n’ime obodo ebe ahụ.

N’akụkụ nke ya, minista na-ahụ maka mgbasa ozi, bụ Mazị Laị Mọhammed kwuru na e bubatara ndị ahụ n’elekere atọ nke ọnụ ụtụtụ ụbọchị Wednesday. O kwuru na ọ bụ site n’ụzọ mkpukè ka e siri bubata ụmụakwụkwọ ahụ, ma sị na ọ bụ n’ihi ịgbasi mbọ ike nke ọchịchị onyeisi ala Muhammadụ Buharị mere e jiri wee tọhapụ ụmụaka ahụ n’ihi na ọ (Buharị) ghọtara na ihe ahụ abụghị ihe a ga-eji aka ike wee sobe, bụzị nke mere ka ha banye na nkwekọrịta na mkparịta ụbụbọ, iji wee hụ na a tọhapụrụ ha bụ ụmụaka ụmụnwanyị.

N’ịgba aka ebe banyere nke ahụ, onyeisi otu jikọtara ndị nne na nna n’ụlọ akwụkwọ ahụ, bụ Mazị Bashir Manzo kọwakwara na ndị agbataobi ya e soro tọrọ ụmụ ha kpọrọ ya ma kọwatara ya na a tọhapụrụla ha ụmụ ha.

Otu ọ dị, otu ndọrọ ndọrọ APC egosipụtala obi ụtọ ha banyere ntọhapụ ahụ kọwaa na nke ahụ na-egosipụta nnọọ na ọchịchị Buharị nwere ezi mmetụta banyere ọnọdụ ụmụafọ ala Nigeria, ma sịkwa na nke ahụ esorokwala n’otu n’ime ọtụtụ ihe ọma dị iche iche Buharị meputagoro n’ihe e rubeghị ahọ anọ ọ banyere n’ọkwa ọchịchị, bụ nke ha kọwara na PDP n’okpuru Goodluck Jonathan apụghị ime n’oge nke ya. Ha kwuru na ọ bụrụ na PDP mere ụdị ihe a n’oge nke ha ma hapụ ịkụ asịrị, agaghị na akọ akụkọ enweghị isi na ọdụ; na ụmụaka Chibọk akaraghị ịnọ ogologo oge ahụ ha nọrọ n’aka ndị Boko Haram.

 

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here