Buharị ka na-agbali na-agbanyeghị ụmụ aka mgba chere ya– Oyegun

0
630
OYEGUN

Oyegun ekwuola na na-agbanyeghị ihe iche aka mgba dị iche iche ọchịchị Muhammadụ Buharị na-agabiga, na ya bụ onyeisi ala gara n’ihu na-emezupute nkwa nile o kwere ụmụafọ Nigeria, na-ekweghị ka ihe ma ọ bụ onye ọbụla kpasaa ya anya.

Izunna Okafor

 

Mazị Oyegun kwuru nke a ụbọchị Tuuzdee n’Abụja ,oge ọtụtụ ndị sitere n’ụlọ akwụkwọ “Federal Polytechnic, Bida, bịara kpọtụrụ isi ụlọ ọrụ otu ndọrọ ndọrọ APC dị n’Abụja. Ọ sị na gọọmenti etiti nke Buharị nọ n’isi ya na-akpa ike dị egwu ma na-agbasi mbọ ike iji hụ na o wetara n’isi njedebe, mkpa mkpa na nsogbu nile nke ndị agha ekweghị ekwe Boko Haram na ndị agha iyi egwu ndị ọzọ na-enye nsogbu n’ala anyị, ma sịkwa na ọ ga-ewekwa inye aka Chineke iji me ka nke ahụ bịa na mmezu.

N’ebe o metụtara mpụ na aghụghọ, maazị Onyegun kwuru na ọchịchị Buharị na-enweta mmeri na-ada ụda n’agha esepughị aka ahụ ọ na-ebu megide mpụ na aghụghọ n’ala anyị. O kwuru na ọ bụ eziokwu na a gaghị ekpochapụ mpụ na aghụghọ dị n’ala Nigeria n’otu ụbọchị n’ihi na ọ taala nchara ma gbanye mgbọrọgwụ, mana Buharị ga-achụpụtacha ma memilachaa ha nile n’otu n’otu nakwa nwayọ nwayọ dịka ọ malitegoro ikwo ha ọdụ.

Na mbụ n’okwu ya, onyeisi ụlọ akwụkwọ ahụ, bụ Dọkịnta Abubakar Dzukogi kọwara na isi sekpụ ntị ha jiri bịa ịkpọtụrụ ya bụ ka ha wee zie ya ka ọ bịa nọnyere ha ma narakwa nkwanye ugwu pụrụ iche a ga-enye ya na nnukwu oke mmemme a ga-eme maka ndị gụchara akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ ahụ, bụ nke ga-ewere ọnọdụ n’abalị iri abụọ na asatọ nke ọnwa a.

 

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here