Igwu ojoro n’oge ule akwụkwọ

0
1164
ule akwụkwọ
ule akwụkwọ

 

ỊGỤ akwụkwọ bụ nnọ ihe mara mma nke ukwu Ọ bụ nke a mere  ndị bekee jiri mee ka mba ụwa nile na-agụ akwụkwọ ka ha wee mara ihe karịa ka ha mara, ka ha kwụsị ịdị na-akpa agwa n’ezighi ezi. Ndị ala anyị sonyekwara ndị mba ụwa ndị ọzọ kwere na ịgụ akwụkwọ dị mma. Ọ bụ nke a mere na nne na nna ọ bụla na-agbasi mbọ ike ka ha wee ziga ụmụ ha ụlọ akwụkwọ.

Uchenwa Mba

Nwata akwụkwọ ọ bụla na erube isi na eme nke oma na oge ule akwụkwọ. Ụfọdụ na eje akwụkwọ mana uche ha adịghị na ya, ha adịghị agụ akwụkwọ ha otu o kwesiri. Ụfọdụ bụ onyonyo ka ha hụrụ n’anya karia ịgụ akwụkwọ ha. Ụfọdụ bụ egwuregwu dị na ekwe ntị ha ka ha ma. Ụfọdụ bụ ndị na-esoro ndị ogbo ha na-ejeghari.

Ma gịnị bụ ule akwụkwọ? Nke a pụtara ohere e ji atule ma nwa akwụkwọ ọ mụtara ihe onye nkuzi kuziiri ya. O kwesịghị ka onye ọ bụla gafere mgbe ọ na emeghị nke ọma ma ọ bụ ka e were ego gotara ya.

Ime nke ọma na ule ga-eme ka mmadụ nwee ezi ọlụ ma ọ bụ na eme nke ọma na ahia ma ọ bụ ọlụ aka nke ọ na-alụ. Oge ụfọdụ,  egwu na ụjọna-atụ ụmụ akwụkwọ ma ha aga ada na eme ha, ha  a baa na igwu ojoro n’oge ule.

Oge ụfọdụ, na mmadụ dara abụghị na ọ maghị akwụkwọ kama n’ihi na ọkwadoghị onwe ya nke ọma n’oge ule akwụkwọ.A ka na-enwe ntapu na ojoro n’oge ule akwụkwọ.

Gịnị bụ ntapu ule ma ọ bụ ojoro n’oge ule? Nke a bụ agwa ọjọọ na ihọrọ ndị ọzọ n’ihi na ha nwere ego ma ọ bụ na ha maara mmadụ karịa ndị ọzọ.Nke a na emebi aha nwa akwụkwọ ma ọ bụ ala ụlọ akwụkwọ. Ihe ọjọọ a gụnyere ndị ọjọ nọ n’ụlọ ọlụ n’ahụ maka ule akwụkwọ ilesi onye emeghị nke ọma akwụkwọ na-egosi na ọ mere nke ọma ma ọ bụ ịdọkanye onye agụghị akwụkwọ asambodo na ọ gụrụ akwụkwọ n’ebe ahụ. Ọzọkwa, mgbe a na eme ịhọpụta onye ọchịchị, ojoro na mpụ a na-adikwa na ya.

Oge mbụ, ihe a maara bụ igwụ ojoro n’oge ule bụ nwa akwụkwọ iseti olu ya ka ọ hụ ihe onye ọzọ na-ede ma ọ bụ ijụ ndị ọzọ ihe, ma ugbua, ọtụtụ ụzọ ka e sizi eme nke a .Ụfọdụ na-eji ekwentị, ụfọdụ na ede ihe n’obo aka ha ma ọ bụ na apata ụkwụ, ma ọ bụ na mpempe akwụkwọ. Ụfọdụ ayọọ ka ha je nyụọ amịrị ma ọ bụ nsi ka ha wee nwee ike inyota n’akwụkwọ ha ji.

Mgbe ntapu ule ma ọ bụ ojoro a malitere tibe ala anyị aka bụ n’afọ 1977,mgbe ihe nile a ga-ede na ule ahụ gbara tupu ụbọchị ule. Ọzọkwa bụ n’afọ 1991, ụlọ ọlụ n’ahụ maka ule (WAEC, NECO) nwekwara ntapu ule nke mere na eleghị  ule na onwa nke ise na nke asaa (May/June) kama ha bụgharịrị ya na onwa nke asatọ na nke itolu (August/September) nke afọ ahụ.

Onwekwara nke a na-akpọ ‘special centre’, ebe a na-ana ndị mmadụ ọtụtụ ego iji wee nabata ha ịnọ n’ụlọ akwụkwọ ha dee ule ha ka ha wee bụrụ ndị mere nke ọma karia ndị ọzọ. Ndị nne na nna na enye aka na ntapu ule a ana ekwu maka ya. Ụfọdụ, n’ihi na ha maara ndị na-alụ n’ebe a na-ahụ maka ule (WAEC/NECO) na-enwe ike inweta akwụkwọ ule ndi a tupu oge ule eruo. Nke a na-eme ka ndị nke ha nwee akwụkwọ ule ahụ.

N’oge dịka afọ iri anọ gara aga, ọ bụ nanị ụmụ akwụkwọ ka a na ahụ na-eme ntapu ule ma ọ bụ igwu ojoro na oge ule.Ha na- adikwa ole na ole na egwu ojoro a n’ihi na onye ọ bụla n’agba mbọ ka a gunye ya na ndị na-eme nke ọma na ụlọ akwụkwọ ma ọ bụ mgbe a gụsịrị ka onwee ike inweta ọlụ di mma.

Ndị a bụ ndị na eme ka enwee ntapu ule ma ọ bụ ojoro.Ndị nkuzi, ndị nne na nna, ndị na-ahụ maka ule, ndị isi ụlọ akwụkwọ sokwa. Ihe ha jiri dị ya bụ na ụfọdụ nwere akpiri ego. Ụfọdụ nne na nna agụghị akwụkwọ ha na ụzọ kwụ ọtọ.Ụfọdụ bụ ego ka ha ji gota akwụkwọ ha ji alụ ọlụ. Ụfọdụ nne na nna na-egotara ụmụ ha onye ga-edere ha ule ha. Ndị isi ụlọ akwụkwọ ụfọdụ sokwa enye aka na ojoro ule n’ihi na ha na akwado ụmụ akwụkwọ ha ịtụ ego a ga enye onye ga-abịa ịhụ maka ule nke ụlọ akwụkwọ ha.

Ụfọdụ ihe na-ebute igwu ojoro ma ọ bụ ntapu ule bụ n’ihi na ndị ala anyị chọrọ ka onye ọ bụla gụrụ akwụkwọ jiri asambodo kachasị mma.

Ihe e kwesịrị ime ka ihe a bụ ntapu na igwu ojoro belata bụ ndị nne na nna na ndị isi ụlọ akwụkwọ di iche iche ị malite ịgwa ụmụ ha na ndị ha na ha bi ka hai ka ha n’agụsi akwụkwọ ha ike ka ọ ga-abụ n’oge ule, ihe nile ga-adigwo n’isi ha nke  ga-eme ka aghara inwe ojoro ọ bụla.

 

 

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here