Obodo edere jim ka eduru Obianọ n’iyi ọrụ

0
591
Gọvanọ Obiano (n’aka nri), mgbe onye Ọka Ikpe Ukwu Steeti Anambra bụ Peter Umeadi (n’aka ekpe) na-edu ya n’iyi ọlụ maka ị chị Anambra nke ugboro abụọ
  • O kwe nkwa ihe ndị ọ ga-eme

 

AWKA bụ isi obodo steeti Anambra dere nnọọ jimjim dịka ọha obodo zukọrọ na mmemme idu aka na-achị steeti ahụ bụ Gọvanọ Willie Obianọ na osote ya bụ Dọkịnta Nkem Okeke n’iyi ọrụ.

IZUNNA OKAFOR

Mmemme idu n’iyi ọrụ ahụ bụ nke weere ọnọdụ n’ama egwuregwu Alex Ekwueme ma bụrụkwa nke e mere kpọmkwem n’elekere mbụ nke ehihe ụbọchị Satụdee gara aga, site n’aka ọka ikpe steeti ahụ bụ ọka-ikpe nkwụmọtọ Peter Umeadị.

N’okwu ya n’oke mmemme ahụ, Gọvanọ Willie Obianọ kelere ọha mmadụ ndị bịara ịhụ ka ya bụ mmemme siri gaa, ma bunyekwa ndị Anambra ụkpa ekele pụrụ iche maka ịgosi na ọrụ ọ na-arụ dị ha ahụ mma, ma kwụghachikwa ya site n’ịhọpụtagharị ya na osote ya n’abalị iri na asatọ nke ọnwa Nọvemba ahọ gara aga, iji sị ha chịrị gaba n’ihu.

O kwere nkwa ma kwesie ya ike na ọchịchị ya nke abụọ ga-amagbu onwe ya, ebe ọ ga-arụpụtasịkwa ọtụtụ ezi ọrụ pụrụ iche ma mepụtakwa ọtụtụ ihe a hụrụ anya karịa ka o mepụtara n’ọchịchị ya nke mbụ.

Ya bụ aka na-achị achị forokwara ntutu taa, sị na ya agaghị ekwe ndị omekome na ndị ekperima ñụrụ mmiri tọgbọ iko ma ya fọdụzie inwe ọnọdụ ọzọ na steeti ahụ. Ọ rịọzịkwara ụmụafọ Anambra ka ha gaa n’ihu inye ha nkwàdo dịka ha nyere ha n’oge gara aga iji wee mezupute nkwa nile ha kwere ha n’oge ha na-achụ nta nkwàdo.

Mmemme ahụ dọtara ọtụtụ ndị Anambra sitere n’ebe dị iche iche, ndị e ji okwu ha agba izù na ndị ukwu ndị ukwu ndị ọzọ wụchara n’ebe ahụ, ndị gụnyere aka na-achị steeti Ebonyi, bụ Gọvanọ Dave Ụmahi, ogbo ya nke Enugu bụ Gọvanọ Ifeanyị Ugwuanyị, nke Delta bụ Gọvanọ Ifeanyị Okowa, nke steeti Ekiti bụ Gọvanọ Ayọdele Fayọse; minista na-ahụ maka ọrụ na inye ọrụ, bụ Dọkịnta Chris Ngige; onyeisi otu Ọhaneze Ndị Igbo n’ala anyị bụ Dọkịnta Nnịa Nwodo; ndị nnọchite anya ọgbọ nta nkwado sineeti atọ e nwere na steeti ahụ, bụ Chiifu Victor Umeh, Dọkịnta Andy Ụba na Oriakụ Stella Odua, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ.

GUO:  Ụmụafọ Nigeria enyela Obianọ onyinye nkwanye ugwu n'Austria

Ụfọdụ ụmụafọ Igbo na-ewu ewù n’iti egwu, nke gụnyere Tekno na Flavour wụchakwara n’ebe ahụ wee were egwu oringo kpọrie ndị mmadụ ụbụrụ.

 

 

 

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here