Oriaku Obiano ejikọọla nwanyị agbakere ya na ezinaụlọ ya kemgbe afọ iri atọ na asatọ

0
830
Eberechukwu Obiano

 

NWUNYE aka na-achị Anambra Steeti bụ Oriakụ Eberechukwu Obianọ e meela ka ọńụ na ihunanya bie ọma site n’ịhafe otu nwanyi ajadu aha ya bụ Rose Anene, onye dị afọ iri asaa na abụọ n’aka ezinaụlọ ya. Nwaanyị a bụ onye e kwuru na ọ hapụrụ ezinaụlọ ya tinye isi n’ebe mmadụ amaghị kemgbe afọ iri atọ na asatọ n’ihi isi mgbaka.

Chinwendu Uzoatu

 

A chọpụtara dịka akwụkwọ e ji edọkọ ihe si gosi na ọ bụ n’afọ 20O4 ka e si Lagos wee kpọta Oriaku Anene n’ụlọ ebe a na-elekọta ndị nwere nsogbu isi na Nteje nke dị n’okpuru ọchịchị Oyi.

E kwukwara na ọ bụ n’afọ 2014 (mgbe ha batachara n’ọchịchị) ka Oriaku Obiano ji wee gosipụta mmasị pụrụ iche n’ebe ya bụ nwanyị  bụ  nne  ụmụ ise, wee bido nyebe ya ọgwụgwọ.

Onye Kọmishọna na-ahụbu maka ọdịmma ụmụnwanyi na steeti a bụ Dọkịnta Victoria Chikwelu kwuru na ọ bụ nwa mgbe gara aga ka Oriakụ Obiano jikọtakwara ya bụ nwanyi na ezinaụlọ ya n’Awka, Anambra Steeti.

Kọmishọna a kwuru si, “ka Oriaku Anene kwuputara na ọ bụ onye Awka, anyị mere nyocha wee nwee ike chọpụta ma hafekwa ya n’aka ụmụ ya n’Umudioka Awka.”

Ọ bụ ka a nọ n’emume ‘2018 International Women’s Day and Discharge of Former Mentally Challenged Persons’, na nsonso a ka Oriaku Obiano nọzi wee hanye Oriaku Rose Anene n’aka dịọkpara ya bụ Azubike Anene n’ihu ụmụ ya abụọ ndị ọzọ nọkwa ebe ahụ.

Oriakụ Obiano, onye nke obi ya juputara n’ọńụ maka nke a kwuru na ọnụọgụ ihe karịrị mmadụ iri isii na abụọ ndị sitere na steeti dị iche iche dịka, Anambra, Abia, Edo, Ebonyi, Oyo wdg bụ ndị natachagoro ọgwụgwọ na Nteje kemgbe di ya bụ Gọvanọ Willie Obiano batachara n’ọchịchị n’afọ 2014.

GUO:  Nwunye Obianọ arụọrọla ajadu abụọ ụlọ

O kwuru si, “Anyị na-enye Chineke otito nile maka mgbake nke mmadụ iri na otu anyị na-ahapụzị ka ha laba taa, ọ kachasi nwanne anyi nwanyị Rose.” Ọ gakwara n’ihu na-ekwu si, “O nwere ike ịmasi unu ịmata na otu n’ime ha bụ onye e nyere nkwado o wee gaa ụlọ ọgwụ Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu ‘University Teaching Hospital’, Awka, ebe a nọrọ wapụ ya akpụ nke dị ya n’aka abụọ. Anyị emetụtana ndụ ọtụtụ ndị mmadụ n’ụzọ dị mma n’obodo anyị site n’ịrụrụ ụmụnwanyị ajadu ụlọ, sitekwa n’ịrụ ụlọ ebe a na-eje mposi maka ikwalite adimọcha n’ahịa dịga n’ime obodo, inye ọzụzụ ma kwadokwa ihe kariri ụmụnwanyị puku atọ na iri abụọ.”

Ha na-elebakwa anya nke ọma n’ebe ụmụaka nọ, ndị nwere nsogbu isi w.d.g. Ndị nke na-adịcha mma tupu a hafee ha n’aka ezinaụlọ ha. O gosiri afọma ebe dị ya bụ Gọvanọ Obiano nọ site na nkwado di iche iche ọ na-enye; onye nke o kwuru na ọ na-esitekwa n’ụgwọ ọnwa ya na-enye nkwado.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here